Izikiel 7:19 - Bible Nso19 Ọla-ọcha-ha ka ha gātufu n'èzí nile, ọla-edo-ha gāghọ kwa ihe-isọ-nsọ; ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha agaghi-enwe ike inaputa ha n'ubọchi nrubiga-ókè nke iwe Jehova; ha agaghi-eme ka afọ ju nkpuru-obi-ha, ha agaghi-emeju kwa ngiri-afọ-ha: n'ihi na ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ha ka ọ buworo. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a19 “ ‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie. Faic an caibideil |
N'ihi na onye ọ bula n'ulo Israel, ma-ọbu onye ọ bula nime ndi-ọbìa nke nọ dika ọbìa n'Israel, nke nēkewapu onwe-ya n'isom, we me ka arusi nile ya ba n'obi-ya, nke nētiye kwa ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume-ya na ncherita-iru ya, we biakute onye-amuma iju ase bayerem n'aka ya; Mu onwem, bú Jehova, gāza ya n'Onwem: