Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 7:15 - Bible Nso

15 Mma-agha di n'èzí, ajọ ọria nke nēfe efe na oké unwu di kwa n'ulo: onye nọ n'ọhia gānwu na mma-agha; ọzọ, onye nọ n'obodo, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gērichapu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mma agha dị nʼezi; ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime. Onye nọ nʼọhịa ga-anwụ site na mma agha, ndị nọ nʼime obodo ukwu ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 7:15
9 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na apuam je n'ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n'obodo a, le, ndi nāria ọria site n'oké unwu! n'ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n'ala, ma ha amaghi ihe.


Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku; Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku: N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di.


Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo; N'ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi.


Ma M'gēme ka ndikom ole-na-ole nime ha fọdu pua na mma-agha, na n'oké unwu, na n'ajọ ọria nēfe efe; ka ha we kọ akukọ ihe-árú nile ha n'etiti mba nile ebe ha gābiawori; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Otù uzọ n'uzọ atọ nime gi gānwu site n'ajọ ọria nēfe efe, ọ bu kwa site n'oké unwu ka ha gāgwusi n'etiti gi; otù uzọ n'uzọ atọ gāda site na mma-agha buruburu gi; ọzọ, otù uzọ n'uzọ atọ ka M'gāb͕asa nye ifufe nile, M'gāmiputa kwa mma-agha n'azu ha.


Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Kua ọbu-aka-gi, zọ kwa ukwu-gi n'ala, si, Éwù! n'ihi ihe-árú ọjọ nile nke ulo Israel: n'ihi na ha gēsite na mma-agha, site kwa n'oké unwu, site kwa n'ajọ ọria nke nēfe efe, da.


Onye nọ n'ebe di anya gēsite n'ajọ ọria nēfe efe nwua; onye nọ nso gēsite na mma-agha da; onye fọduru nke anānọchigide kwa n'agha gēsite n'oké unwu nwua: M'we mezue ọnumam n'aru ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan