Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 7:10 - Bible Nso

10 Le, ubọchi ahu, le, ọ nābia: chi-ọbubọ-gi aputawo; nkpa-n'aka ab͕awawo okoko, nganga amawo ifuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “ ‘Lee, ụbọchị ahụ! Lee, ka ọ na-abịa! Oke nsogbu enupụtala, mkpanaka agbala okoko nganga amaala ifuru!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 7:10
19 Iomraidhean Croise  

M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha, Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.


N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di: Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha.


N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.


Ahuhu gādiri Asiria, bú ndele nke iwem, nkpa-n'aka ka ọ bu kwa n'aka-ha, bú oké iwem!


Onye-nche siri, Ututu abiawo, ma abali abiawo kwa: ọ buru na unu gāju ase, juanu ase: laghachinu, bia.


Ahuhu gādiri okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ahuhu gādi-kwa-ra okoko-ọhia nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù nke ndi manya-vine nēb͕u!


N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka ilu a kwusi, ha agaghi-atu kwa ya dika ilu n'Israel ọzọ; kama gwa ha okwu, si, Ha di nso, bú ubọchi ahu, ha na okwu ọhù ọ bula.


Ọku we si na nkpa-n'aka nke alaka-ya nile pua, nkpuru-ya ka o ripiaworo, nkpa-n'aka ọ bula nke di ike we ghara idi nime ya ibu nkpa-n'aka-eze ichi achi. Abù-ákwá ka nka bu, o we ghọ abù-ákwá.


amuru ya amu ka o we b͕ue madu nke-uku; emere ya ka ọ nēb͕u maramara ka o we di ka àmùmà: òbi gatọ kwa ayi utọ? nkpa-n'aka nwam, ọ nāju osisi nile ọ bula.


N'ihi na ọnwunwa di; gini gēme kwa ma ọ buru na ọbuná nkpa-n'aka nke nāju aju ghara idi? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ihi na ubọchi di nso, ọ di nso, bú ubọchi Jehova nwere, ọ bu ubọchi igwe-oji; mb͕e nke mba di iche iche ka ọ gābu.


Mb͕e ahu abiawo, ubọchi ahu eruwo nso: ka onye nāzu azu ghara iṅuri ọṅu, ka onye nēre ere ghara kwa iru újú: n'ihi na iwe di ọku diri ìgwè madu-ya nile.


Ọgwugwu abiawo, ọgwugwu ahu abiawo, o tetawo n'ebe i nọ; le, ọ nābia.


Anyam agaghi-enwe kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: dika uzọ-gi nile si di ka M'gētiyekwasi gi ihe, ihe-árú-gi nile gādi kwa n'etiti gi; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, nētib͕u.


Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.


Ewó, ubọchi ahu! n'ihi na ubọchi Jehova di nso, dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.


O rue n'echi-ya, na Moses bara n'ulo-ikwū nke ihe-àmà; ma, le, nkpa-n'aka Eron nke diri ulo Livai amawo ifuru, b͕awa kwa ifuru ahu, wa kwa okoko, mì kwa almond chara acha.


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


Ma Ọ nēnye kari amara. N'ihi nka ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si, Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan