Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 6:4 - Bible Nso

4 Agēme kwa ka ebe-ichu-àjà nile unu tọb͕ọrọ n'efu, agētipia kwa arusi-anyanwu nile unu: M'gēme kwa ka ndi-unu eb͕uru eb͕u da n'iru arusi nile unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 A ga-etikpọ ebe ịchụ aja unu, tipịa ebe unu na-anọ esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Aga m atụsa ndị unu e gburu egbu nʼihu arụsị unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 6:4
13 Iomraidhean Croise  

O we kpọ òkù megide ebe-ichu-àjà ahu n'okwu Jehova, si, Ebe-ichu-àjà, ebe-ichu-àjà, otú a ka Jehova siri: Le, agāmuru ulo Devid otù nwa-nwoke, Josaia bu aha-ya; ọ gāchu kwa n'elu gi ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu gi, ọkpukpu madu ka ha gēsure kwa ọku n'elu gi.


O tipia-kwa-ra ogidi nile, b͕utu kwa Asherim, were ọkpukpu madu mejue ọnọdu-ha.


O si-kwa-ra n'obodo nile nke Juda wezuga ebe nile di elu na arusi-anyanwu nile: ala-eze-ya we di jū n'iru ya.


N'ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ.


O gētipia kwa ogidi nile nke ulo anyanwu, nke di n'ala Ijipt; ọ bu kwa ulo nile nke chi nile nke Ijipt ka ọ gēsure n'ọku.


N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ya Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u: ha gēlì kwa ozu na Tofet n'ihi na ebe ilì ozu adighi.


Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e ndi-ha eb͕uru eb͕u di n'etiti arusi nile ha buruburu ebe-ichu-àjà nile ha, n'ugwu ntà ọ bula di elu, na n'elu ugwu nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, na n'okpuru osisi terebinth ọ bula b͕ara ọhia, bú ebe ha nyere arusi nile ha ihe ísì utọ.


M'gēme ka ebe di elu nke unu tọb͕ọrọ n'efu, M'gēb͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, tukwasi kwa ozu-unu n'ozu nile nke arusi-unu; nkpuru-obim gāsọ kwa unu oyi.


Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, ma, le, Degon adakpuwo iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova; ma ebipuwo isi Degon na ọbu-aka-ya abua, ha we tọb͕ọrọ na nbata-uzọ; nání akuku-ya nke bu azù fọduru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan