Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 5:4 - Bible Nso

4 Ọ bu kwa nime ndia ka i gēweputa kwa ufọdu ọzọ, tubà ha n'etiti ọku ahu, sure ha n'ọku; nime ya ka ọku gēsi pukuru ulo Israel nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ọzọkwa, site na ndị a, ị ga-ewere ụfọdụ tụnye ha nʼime ọkụ ka ha ree ọkụ, site na ha ka ọkụ ga-esi banye nʼụlọ Izrel niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 5:4
7 Iomraidhean Croise  

O rue, n'ọnwa nke-asa, na Ishmael nwa Netanaia, nwa Elishama, onye sitere na nkpuru ndi nwe ala-eze, biara, ya na ndikom iri, ha we tib͕ue Gedalaia, o we nwua, ha tib͕u-kwa-ra ndi-Ju na ndi Kaldea ndi ya na ha nọ na Mizpa.


Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n'obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n'ihe ọjọ nke omume nile unu.


N'okpuru ndò Heshbon ka ndi nāb͕alaga guzoworo nēnweghi ike: n'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, na ire-ọku site n'etiti Saihon, o we ripia akuku Moab, na opu-n'isi nke umu nkpọtu.


n'arọ nke-orú-na-atọ nke Nebukadreza ka Nebuzaradan, bú onye-isi ndi-ob͕ū, mere ka ndi-Ju ufọdu, bú nnù madu na ọgu iri-na-asa na ise, je biri n'ala ọzọ: madu nile di nnù iri na otù na ọgu iri.


I gēweputa kwa n'ebe ahu agiri-isi di ole-na-ole n'ọnu-ọgugu, ke ha n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-nwuda-gi.


Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Nka bu Jerusalem: n'etiti mba nile ka M'doworo ya, ala di iche iche di kwa ya buruburu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan