Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 5:14 - Bible Nso

14 Ọzọ, M'gēme gi ka i ghọ nkpọnkpọ ebe na ihe-ita-uta, n'etiti mba nile nke di gi buruburu, n'anya onye ọ bula nke nāgabiga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 5:14
24 Iomraidhean Croise  

M'we si ha, Unu onwe-unu nāhu ọnọdu ọjọ nke ayi onwe-ayi nọ nime ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, na esure-kwa-ra ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku: bianu ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu kwa ihe-ita-uta ọzọ.


M'gēme kwa ka obodo a ghọ ihe-iju-anya, ka ọ ghọ kwa ihe-ima-ọsọ; ọ gēju onye ọ bula nke nāgabiga n'akuku ya anya, ọ gāma kwa ọsọ n'ihi ihe-otiti-ya nile.


M'gētiyekwasi kwa unu ita-uta di mb͕e ebighi-ebi, ya na itiye n'ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi, nke agaghi-echezọ echezọ.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri; Dika awukwasiworo iwem na ọnumam n'aru ndi bi na Jerusalem, otú a ka agāwukwasi ọnumam n'aru unu, mb͕e unu batara n'Ijipt: unu gāghọ kwa ihe-ọb͕ub͕a-iyi, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, na ihe-ita-uta; ma unu agaghi-ahu kwa ebe a ọzọ.


Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n'ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà; Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n'efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume:


Jerusalem emehiewo nke-uku; n'ihi nka ka ọ ghọworo ihe ruru árú: Ndi nile ndi nāsọpuru ya-ri elelìwo ya anya, n'ihi na ha ahuwo ọtọ-ya: E, ya onwe-ya ezewo ume, we chigharia azu.


N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu; Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.


Agēme kwa ka obodo-ya nile ebi ebi ghọ nkpọnkpọ ebe, ala gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


tutu ekpughe ihe ọjọ gi, dika na mb͕e ita-uta nke umu-ndinyom Siria, na nke ndi nile nọ ya buruburu, bú umu-ndinyom nke ndi Filistia, ndi nāzọpia gi buruburu.


N'ọbara-gi, bú nke i wusiworo, ka ikpe maworo gi, ọ bu kwa n'arusi-gi nile, bú nke i meworo, ka i ruru árú; i we me ubọchi-gi ka ha biarue nso, i we biarue ọgwugwu arọ-gi nile: n'ihi nka ka M'meworo gi ka i ghọrọ mba nile ihe-ita-uta, ka i ghọ-kwa-ra ala nile ihe-ọchì.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Iko nwa-nne-gi nwanyi ka i gāṅu, bú iko nke miri emi nke sa-kwa-ra mbara: i gāghọ onye anāchì ọchì na onye anākwa emò: ọ nānagide ihe ri nne.


M'gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n'efu, ghara inwe onye nāgabiga ha.


Ala-ubi ahu nke tọb͕ọrọ n'efu ka agālu kwa, n'ọnọdu ibu ebe tọb͕ọrọ n'efu n'anya onye ọ bula nāgabiga.


N'ebe-obibi nile unu ka agēme ka obodo nile ghọ nkpọnkpọ ebe, ebe nile di elu gātọb͕ọ kwa n'efu; ka ebe-ichu-àjà nile unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, tọb͕ọrọ kwa n'efu, ka ewe tipia kwa arusi nile unu, ha ewe kwusi, ka ewe b͕utu kwa arusi-anyanwu nile unu, hichapu ọlu nile unu.


Onye-nwe-ayi, dika ezi omume-Gi nile si di, biko, ka iwe-Gi na ọnuma-Gi si n'obodo-Gi, bú Jerusalem, bú ugwu nsọ Gi, laghachi: n'ihi na ọ bu n'ihi nmehie nile ayi, na n'ihi ajọ omume nile nke nna-ayi-hà, ka Jerusalem na ndi-Gi ghọworo ihe-ita-uta nye ndi nile di ayi buruburu.


N'ihi nka ka agēji plough gwu Zaion dika ubi n'ihi unu, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.


I gāghọ kwa ihe-iju-anya, na ilu, na ihe-àkùkù, n'etiti ndi ahu nile ebe Jehova gēdu gi je.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan