Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 48:15 - Bible Nso

15 Ma nnù ami iri-na-abua na ọgu iri nke fọduru n'obosara-ya, n'iru orú nnù uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu, ihe nādighi nsọ ka ọ gābu, ọ gādiri obodo Jerusalem, ibu ebe-obibi na ibu ebe-ita-nri: obodo gādi kwa n'etiti ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 “Ala nke fọdụrụ, nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dị kilomita ise na ọkara ga-abụ ala ọha. A ga-ewu ebe obibi nʼelu ya, wukwaa ebe ịzụ anụ ụlọ. Obodo ga-adị nʼetiti ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 48:15
5 Iomraidhean Croise  

Ndi-nchu-àjà-ya emewo iwum ihe-ike, me ka ihe nsọm nile ghara idi nsọ: ọ dighi ókè ha kpaworo n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ha emeghi kwa ka madu mara ihe di iche n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka ha zonariworo anya-ha, ewe me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ha.


N'akuku anọ ka ọ tùru ya: o nwere mb͕idi buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di nnù na ọgu ise, obosara-ya di kwa nnù na ọgu ise, ikpa ókè n'etiti ihe di nsọ na ihe emere ka ọ ghara idi nsọ.


Ọ bu kwa ndim ka ha gēzí ihe di iche n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ọ bu kwa ihe di iche n'etiti ihe di ọcha na ihe ruru árú ka ha gēme ka ha mara.


Ihe-onwunwe nke obodo a ka unu gēnye kwa, nnù ami iri-na-abua na ọgu iri ka obosara-ya gādi, ogologo-ya gādi kwa orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ: ulo Israel nile gēnwe ya.


ma ọ buru na m'nānọ ọdù, ka i we mata otú anāghaghi ibi obi n'èzí-na-ulo Chineke, ebe ọ bu nzukọ nke Chineke di ndu, bú ide na ntọ-ala nke ezi-okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan