Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 47:2 - Bible Nso

2 O we me ka m'si uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu n'akuku Ugwu puta, o we me ka m'ga buruburu n'uzọ di n'èzí rue ọnu-uzọ-ama di n'èzí, n'uzọ nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma le, miri nēsi n'akuku aka-nri rùputa nke-ntà nke-ntà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 O mere ka m si nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu pụta, ma gaa nʼọnụ ụzọ nke ọwụwa anyanwụ, ebe m hụrụ mmiri ahụ ka o si na ndịda na-asọpụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 47:2
5 Iomraidhean Croise  

O we me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama nke Ugwu, o we tùa ya dika ọtùtù ndia si di;


Jehova we sim, Ọnu-uzọ nka gābu ihe emechiri emechi, agaghi-emeghe ya, ọ dighi kwa onye ọ bula gēsi ya bata, n'ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, esiwo ya bata; o we buru ihe emechiri emechi.


O we me ka m'bia n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu n'iru ulo ahu; m'we hu, ma le, ebube Jehova juputara ulo Jehova: m'we da kpuchie irum n'ala.


O we me ka m'laghachi rue ọnu-uzọ ulo ahu; ma, le, miri nēsi n'okpuru nbata-uzọ nke ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu puta, n'ihi na iru ulo ahu di n'Iru-anyanwu: miri ahu nēsi kwa n'okpuru rùda, site n'akuku aka-nri nke ulo ahu, site n'akuku Ndida nke ebe-ichu-àjà.


Mb͕e nwoke ahu puru ga n'Iru-anyanwu jide eriri n'aka-ya, o we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru nkwonkwo-ukwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan