Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 47:18 - Bible Nso

18 Ma akuku Iru-anyanwu, site n'etiti Hauran na Damaskọs na Gilead, na ala Israel, gābu Jọdan; site n'ókè-ala Ugwu rue oké osimiri nke Iru-anyanwu ka unu gātù. Nka bu kwa akuku Iru-anyanwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-esite nʼagbata Hauran na Damaskọs soro akụkụ osimiri Jọdan, nʼagbata ndị Gilead na ala ndị Izrel ruo nʼosimiri dị nʼọwụwa anyanwụ, ruokwa Tama. Nke a ga-abụkwa oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 47:18
12 Iomraidhean Croise  

Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.


Lot we rọputara onwe-ya Gburugburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije je n'Iru-anyanwu: ha we kewapu onwe-ha otù n'aru nwa-nne-ya.


Ọ we chiri umu-nne-ya tiyere onwe-ya, nāchu ya ije nke ubọchi asa, we chukuru ya n'ugwu Gilead.


Leban we kpọ ya Jega-sahaduta: ma Jekob kpọrọ ya Galeed.


Ha we nọdu iri nri: ha we welie anya-ha, hu, ma, le usu-ije ndi Ishmael si na Gilead nābia, camel-ha nēbu kwa uda na balm na myrrh, nēje iweda ya n'Ijipt.


Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji: Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya.


M'gēme kwa ka Israel lata n'ebe-ita-nri-ya, ọ gāta kwa nri na Kamel na Beshan, ọ bu kwa n'ugwu Efraim na nime Gilead ka afọ gēju nkpuru-obi-ya.


Hemat, Berota, Sibraim, nke di n'etiti ókè-ala Damaskọs na ókè-ala Hemat; Haza-hatikon, nke di n'ókè-ala Hauran.


ma M'gēme ka usu-ndi-agha Ugwu ahu si n'aru-unu je n'ebe di anya, M'gāchubà kwa ya n'ala kpọrọ nku na ebe tọb͕ọrọ n'efu, iru-ya n'oké osimiri Iru-anyanwu, na nsọtu-Ya n'oké osimiri Ọdida-anyanwu; ísì ọjọ ya gārigo kwa, e, ísì-ya nke jọb͕uru onwe-ya gārigo, n'ihi na o mewo onwe-Ya uku n'ime ihe.


Ma umu Reuben na umu Gad nwere ọtutu anu-ulo, ha riri nne nke-uku: ha we hu ala Jeza, na ala Gilead, ma, le, ebe ahu bu ebe anu-ulo;


Unu gākpaputa-kwa-ra onwe-unu, ka ọ buru ókè-ala Iru-anyanwu, site na Heza-inan rue Shefam:


Ha we tipia, kpab͕u kwa umu Israel arọ ahu: arọ iri na asatọ ka ha kpab͕uru umu Israel nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ala ndi-Amorait, nke di na Gilead.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan