Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 47:14 - Bible Nso

14 Unu gēketa kwa ya, otù onye dika nwa-nne-ya; n'ihi na ewelirim akam inye ya nna-unu-hà: ala nka gādaye n'aka-unu n'ihe-nketa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ebo ọbụla ga-eketa dịka ibe ya ketara, nʼihi na-eweliri m aka ṅụọ iyi na m ga-enye ndị nna nna unu ala ahụ, na ala a ga-aghọkwa ihe nketa unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 47:14
16 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu.


n'ihi na ala nka nile nke gi onwe-gi nāhu anya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ọ si ya, Mu onwem bu Jehova Nke mere ka i si n'Ua nke ndi Kaldea puta, inye gi ala nka inweta ya.


M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke.


nọ dika ọbìa n'ala nka, M'gānọye-kwa-ra gi, gọzie gi; n'ihi na gi na nkpuru-gi ka M'gēnye ala ndia nile, M'gēme kwa ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru Abraham nna-gi;


Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi;


M'gēme kwa ka unu bata n'ala ahu, nke M'weliri akam iwere ya nye Abraham, nye kwa Aisak, nye kwa Jekob; M'gēnye kwa unu ya ka ọ buru ihe-nnweta: Mu onwem bu Jehova.


Anēfe nzà, Ma n'aka Jehova ka ikpé-ya nile sitere.


N'ihi na mb͕e M'mere ka ha ba n'ala ahu, nke M'weliri akam elu inye ha, ha we hu ugwu ntà nile ọ bula di elu, na osisi nile ọ bula b͕ara ọhia, ha we chua àjà nile ha n'ebe ahu, nye nkpasu-iwe nke onyinye-ibiaru-nso-ha n'ebe ahu, do ihe-ísì-utọ nile ha n'ebe ahu, wusi àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha n'ebe ahu.


Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēme ka unu ba n'ala Israel, n'ala ahu nke M'weliri akam elu iwere ya nye nna-unu-hà.


M'gēme kwa ka madu jegharia n'elu unu, ọbuná ndim, bú Israel; ha gēnweta kwa gi, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-nketa, i gaghi-ab͕aba kwa ha aka umu ọzọ ma-ọli.


Nka bu ala ahu nke unu gēme ka ọ dayere ebo nile nke Israel n'ihe-nketa, ọ bu kwa ndia bu òkè-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ihi na Jehova apughi ime ka ndi nka ba n'ala ahu nke Ọ ṅuru ha iyi inye ha, n'ihi ya ka O b͕uworo ha n'ọzara.


unu onwe-unu agaghi-abà n'ala ahu ma-ọli, nke M'buliri akam ime ka unu biri nime ya, ma-ọbughi Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.


Le, edowom ala ahu n'iru unu: banu, nweta ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi, bú Abraham na Aisak na Jekob, inye ha, inye kwa nkpuru-ha gānọchi ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan