Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 47:12 - Bible Nso

12 Ọ bu kwa n'osimiri ahu, n'usọ-ya, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ka osisi ọ bula nke nāmi nkpuru oriri gēto, akwukwọ-ya agaghi-akpọnwu, nkpuru-ya agaghi-agwu kwa: kwa-ọnwa ka ọ gēme nkpuru mbu, n'ihi na miri-ya, n'ebe nsọ Chineke ka ha si aputa: nkpuru-ya ewe buru ihe-oriri; akwukwọ-ya gābu kwa ihe igwọ agwọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mkpụrụ osisi dị iche iche ga-eto nʼakụkụ abụọ nke iyi ahụ. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, mkpụrụ ga-adị nʼelu ha mgbe niile. Mkpụrụ ọhụrụ ga-adị nʼọnwa ọbụla, nʼihi na ọ bụ mmiri si nʼebe nsọ ahụ na-agba ha mmiri. Mkpụrụ ha ga-abụ nri, akwụkwọ ha ga-abụkwa maka ịgwọ ọrịa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 47:12
11 Iomraidhean Croise  

Jehova, bú Chineke, we me ka osisi nile ọ bula si n'ala pue, bú nke anāchọsi ike n'ile anya, nke di kwa nma ihe-oriri; osisi nke ndu dikwa n'etiti ubi ahu ab͕ara ogige, na osisi nke ima ezi ihe na ihe ọjọ.


Dika osisi ndu ka ọ di n'iru anyanwu, Ome-ya nēpusa n'ubi-ya ab͕ara ogige.


Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.


Onye ezi omume gāwa igù dika nkwu: Dika osisi cedar nime Lebanon ka o gēbù ibù.


Site n'ọbu-ukwu we rue isi ọ dighi izu-okè di nime ya; kama ob͕ub͕u-mma, na itiru-aru, na ọnyá etiputara ọhu: apikọtaghi ha, ekechighi kwa ha, ejighi kwa manu me ka ha di nrò.


Ndi-gi kwa, ha nile gābu ndi ezi omume, rue mb͕e ebighi-ebi ka ha gēnweta ala; alaka nke ọkukúm, ọlu akam, ime ka M'ma nma.


idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.


Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku miri, ọ bu kwa n'akuku osimiri ka ọ nāwasa nkpọrọgwu-ya, ọ dighi-atu kwa egwu mb͕e okpom-ọku nābia, ma akwukwọ-ya gābu akwukwọ ndu; ọzọ, n'arọ nb͕ochi miri-ozuzo ọ gaghi-echeb͕u onwe-ya, ọ gaghi-apu kwa n'imì nkpuru.


Ọ̀ dighi balm di na Gilead? ọ̀ dighi dibia nọ n'ebe ahu? ọ̀ bu kwa gini mere anu-aru ọhu nējighi epuchi n'aru ada ndim?


Mb͕e m'laghachiri, le, n'usọ osimiri ahu ka ọtutu osisi nke bara uba nke-uku di, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ.


n'etiti amá-ya. N'akuku a na n'akuku nke-ọzọ nke osimiri ahu ka osisi nke ndu di kwa, nāmi uzọ nkpuru iri na abua, nēnye nkpuru-ya n'ọnwa n'ọnwa: akwukwọ osisi ahu bu ihe ime ka aru di mba nile ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan