Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 46:2 - Bible Nso

2 Onye-isi gēsi kwa n'uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama n'èzí bata, guzo n'akuku akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, ndi-nchu-àjà gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya, na àjà-udo-ya nile, ọ gākpọ kwa isi ala na nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, we pua: ma agaghi-emechi ọnu-uzọ-ama rue anyasi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 46:2
18 Iomraidhean Croise  

Devid, bú eze, we ba, nọdu ala n'iru Jehova; ọ si, Ònye ka m'bu, Jehova, bú Chineke, gini kwa ka ulom bu, na I mewo ka m'biarue na mb͕e a?


ma ha nọ rue ub͕u a n'ọnu-uzọ-ama eze n'akuku ọwuwa-anyanwu: ndi ahu bu ndi-ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū umu Livai nwere.


ọ hu, ma, le, eze nēguzo n'akuku ogidi-ya na nbata, ndi-isi na opì-ha di kwa n'akuku eze; ndi nile nke ala ahu ṅuri-kwa-ra ọṅu, fùa opì; ndi-ọbù-abù ji kwa ihe abù kpọ, ndi nēme ka amara ito otuto nọ kwa. Atalaia we dọwa uwe-ya nile, si, Nkekọta imegide eze, nkekọta imegide eze.


Ma mb͕e ha surebìsiri àjà-nsure-ọku, eze na ndi nile ahuru n'ebe ọ nọ ruru ala, we kpọ isi ala.


Eze we guzo n'ọnọdu-ya, b͕a ndu n'iru Jehova, ijeso Jehova, na iwere obi-ya nile na nkpuru-obi-ya nile debe ihe nile O nyere n'iwu, na ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, ime okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu nka nke edeworo n'akwukwọ a.


(n'ihi na Solomon mere ebe-nguzo di elu nke ọla-cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, cubit atọ ka idi-elu, ya di kwa, o we tiye ya n'etiti ogige; o we guzo n'elu ya, b͕u ikperè-ya n'ala n'iru nkpọkọta nile nke Israel, b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:)


O we tùa obosara-ya site n'iru ọnu-uzọ-ama ahu nke dikari ala rue iru nke ogige di nime n'èzí, ọgu cubit ise, n'akuku Iru-anyanwu na n'akuku Ugwu.


Ọzọ, n'ulo-nbata nke ọnu-uzọ-ama ka table abua di n'otù akuku, table abua di kwa n'akuku nke-ọzọ, ha ewe b͕ue n'elu ha àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie na àjà-ikpe-ọmuma.


Ma onye-isi-unu, dika onye-isi ka ya onwe-ya gānọdu ala nime ya iri nri n'iru Jehova; ọ gēsi uzọ nke uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama nka bata, si kwa uzọ-ya pua.


Onye-nchu-ajam gēwere ufọdu n'ọbara àjà-nmehie ahu, tiye ya n'akuku-ọnu-uzọ nke ulo a, na n'ebe nkuku anọ nke ngwe diri ebe-ichu-àjà nka, na n'elu akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime.


Ma mb͕e onye-isi gēdozi àjà-afọ-ofufo, ma ọ bu àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà-udo, iburu Jehova onyinye-afọ-ofufo, agēmeghere ya ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'Iru-anyanwu, ọ gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya na àjà-udo-ya nile, dika o si eme n'ubọchi-izu-ike: ọ gāpu kwa, ewe mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ọ pusiri.


Ma mb͕e onye-isi-unu gābata, uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama ahu ka ọ gēsi bata, ọ bu kwa uzọ-ya ka ọ gēsi pua.


O we ga n'iru nke-ntà, da kpuchiè iru-Ya n'ala, we kpe ekpere, si, Nnam, ọ buru na ọ gēkwe me, ka iko a gabigam: ma ọ bughi dika Mu onwem nāchọ, kama dika Gi onwe-gi nāchọ.


Onye ayi nēkwusa, nādu madu nile ọ bula ọdú, nēzí kwa madu nile ọ bula n'amam-ihe nile, ka ayi we che madu nile ọ bula n'iru Onye-nwe-ayi dika ndi zuru okè nime Kraist;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan