Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 45:7 - Bible Nso

7 Ihe onye-isi-unu nwere gādi kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo a, n'iru àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na n'iru ihe-onwunwe nke obodo a, n'akuku Ọdida-anyanwu chere iru n'Ọdida-anyanwu, na n'akuku Iru-anyanwu chere iru n'Iru-anyanwu: ogologo-ya gādi kwa n'akuku otù nime òkè ndia, site n'ókè-ala Ọdida-anyanwu rue ókè-ala Iru-anyanwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “ ‘A ga-ewepụta ala pụrụ iche maka nwa eze. Ala a ga-adị nʼakụkụ abụọ nke ala nsọ ahụ, na obodo ahụ. Ala a ga-agbatịrị site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ebe oke ya dị ruo nʼosimiri Mediterenịa. Ọ ga-esitekwa nʼoke ala ya nʼọwụwa anyanwụ gbatịrị ruo nʼebe ebo Izrel nwere ala ha. Nʼụzọ dị otu a, ala a ga-aha ka ala ebo Izrel ketara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 45:7
8 Iomraidhean Croise  

Mu onwem, bú Jehova, gābu-kwa-ra ha Chineke, orùm, bú Devid, gābu kwa onye-isi n'etiti ha; Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.


Orùm, bú Devid, gābu kwa eze-ha; ọ bu kwa otù onye-ọzùzù-aturu ka ha nile gēnwe: ọ bu kwa n'ikpém nile ka ha gējeghari, ukpurum nile ka ha gēdebe kwa, me ha.


Ma nke fọduru gādiri onye-isi, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo, n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri nke àjà-nbuli ahu rue ókè-ala Iru-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu rue ókè-ala Ọdida-anyanwu, n'akuku òkè nile, ọ gādiri onye-isi: àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na ebe nsọ nke ulo Chineke gādi kwa n'etiti ya.


Ha we mesia ka eketa ala ahu dika ókè-ala-ya nile si di; umu Israel we nye Joshua nwa Nun ihe-nketa n'etiti ha:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan