Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 44:16 - Bible Nso

16 ha onwe-ha gābata n'ebe nsọm, ha onwe-ha gābiaru kwa table nkem nso, ijerem ozi, ha gēdebe kwa ihe-ndebem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ọ bụ naanị ha ga-abanye nʼime ebe nsọ m, naanị ha ga-abịakwa na tebul m ije ozi nʼihu m, na ife m dịka ndị nche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 44:16
10 Iomraidhean Croise  

nọkwasi n'ihe-ndina di nsọpuru, nke table edoro n'usoro di kwa n'iru ya, ọ bu kwa ihe-nsure-ọkum nke nēsì ísì utọ na manum ka i dọbara n'elu ya.


Ebe-ichu-àjà-ya bu osisi, cubit atọ n'idi-elu-ya, ogologo-ya di kwa cubit abua: ọ nwe-kwa-ra nkuku-ya anọ; ogologo-ya na akuku-ya nile bu kwa osisi: o we gwam okwu, si, Nka bu table ahu nke di n'iru Jehova.


Ma unu onwe-unu nēme ka ọ ghara idi nsọ, n'isi, Table nke Jehova, ihe emere ka ọ ghara idi nsọ ka ọ bu, nkpuru-ya, bú ihe-oriri-Ya, bu kwa ihe-nlelì.


Unu nēweta nso achicha emere ka ọ ghara idi nsọ n'elu ebe-ichu-àjàm. Ma unu nāsi, Nìme Gini ka ayi meworo Gi ka I ghara idi nsọ? N'isi, Table nke Jehova, ihe nlelì ka ọ bu.


Ọ̀ bu unu ihe ntà na Chineke nke Israel akpawo ókè n'etiti unu na nzukọ Israel, ime ka unu biarue nso Ya; ifè òfùfè nke ebe-obibi Jehova, na iguzo n'iru nzukọ ahu ijere ha ozi;


Unu gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe nsọm, na ihe-ndebe nke ebe-ichu-àjàm: ka iwe we ghara idikwasi umu Israel ọzọ.


O we me ka ayi buru ala-eze, ndi-nchu-àjà nye Chineke na Nna nke Ya; ọ bu Ya ka otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Ma M'gēme ka onye-nchu-àjà nke kwesiri ntukwasi-obi bilierem, ọ bu dika ihe si di nke di nime obim na nime nkpuru-obim ka ọ gēme: M'gēwu-kwa-ra ya ulo kwesiri ntukwasi-obi, ọ gējeghari kwa n'iru onye nkem etere manu ubọchi nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan