Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 44:10 - Bible Nso

10 Otú ọ di, ndi Livai ndi si n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, mb͕e Israel kpafuru akpafu, ndi siri n'ebe M'nọ kpafue so arusi nile ha; ha aghaghi ibū kwa ajọ omume-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “ ‘Ndị ikom agbụrụ Livayị niile, ndị sitere nʼijere m ozi wezuga onwe ha mgbe Izrel bidoro ịgbaso arụsị niile ha, ga-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 44:10
20 Iomraidhean Croise  

Ken we si Jehova, Ahuhu ajọ omumem di uku kari obubu.


ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, na ndi-nchu-àjà-ayi, na nna-ayi-hà, ha emeghi kwa iwu-Gi, ha aṅaghi kwa nti n'ihe nile I nyere n'iwu na n'àmà-Gi nile, nke I b͕ara megide ha.


N'ihi na ajọ omumem nile agabigawo n'elu isim: Dika ibu arọ́ ha dikaram arọ́.


Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa: Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?


Ihe nke sitere na ndọb͕u nkpuru-obi-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ka ọ gāhu, afọ gēju ya: ihe-ọmuma-ya ka onye ezi omume ahu, bú orùm, gēji me ka ọrà madu ghọ ndi ezi omume: ajọ omume nile ha ka ya onwe-ya gēbu kwa.


N'ihi na emeruwo ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà; e, n'ulom ka M'chọputaworo ihe ọjọ ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


ka ulo Israel we ghara ikpafu kwa ọzọ n'isom, ghara kwa iwere njehie nile ha merua onwe-ha ọzọ; ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ndi-nchu-àjà-ya emewo iwum ihe-ike, me ka ihe nsọm nile ghara idi nsọ: ọ dighi ókè ha kpaworo n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ha emeghi kwa ka madu mara ihe di iche n'etiti ihe ruru árú na ihe di ọcha, ọ bu kwa ubọchi-izu-ikem nile ka ha zonariworo anya-ha, ewe me ka M'ghara idi nsọ n'etiti ha.


N'ihi na ha nējere ha ozi n'iru arusi nile ha, we ghọrọ ulo Israel ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume; n'ihi nka ka M'weliri akam imegide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ha gēbu kwa ajọ omume-ha.


Ma ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, umu Zedok, ndi debere ihe-ndebe nke ebe nsọm mb͕e umu Israel siri n'ebe M'nọ kpafue, ndi ahu gābiakutem nso ijerem ozi; ha gēguzo n'irum iweta nsom abuba na ọbara; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta:


Ọ gādiri ndi-nchu-àjà ndi edoworo nsọ site n'umu Zedok, ndi debeworo ihe-ndebem; ndi nākpafughi mb͕e umu Israel kpafuru akpafu, dika ndi Livai kpafuru.


Ọ gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà: M'gēji kwa uzọ-ya nile leta ya, ọ bukwa omume-ya nile ka M'gēnyeghachi ya.


ma onye nēri ya gēbu ajọ omume-ya, n'ihi na ihe nsọ nke Jehova ka o meworo ka ọ ghara idi nsọ: aga ebipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya.


Ndi-amuma-ya bu ndi obi-ha nādighi n'otù ebe, ndi-nghọb͕u: ndi-nchu-àjà-ya emewo ka ihe nsọ ghara idi nsọ, ha emewo iwu ihe-ike.


Ma unu onwe-unu ewezugawo onwe-unu n'uzọ Chineke; unu emewo ka ọtutu madu su ngọngọ n'iwu; unu ebibiwo ọḅuḅa-ndu Livai, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ma ndi Livai gēfè òfùfè ahu nke ulo-ikwū nzute, ha onwe-ha gēbu kwa ajọ omume-ha: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu rue ọb͕ọ nile unu, ma n'etiti umu Israel ha agaghi-eketa ihe-nketa.


Nwoke ahu gāpu kwa n'ajọ omume, ma nwayi gēbu ajọ omume-ya.


Ebikwasila onye ọ bula aka n'isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan