Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 43:8 - Bible Nso

8 mb͕e ha nētiye nbata-uzọ-ha n'akuku nbata-uzọ nkem, na akuku-ọnu-uzọ-ha n'akuku akuku-ọnu-uzọ nkem, ọ bu kwa nání mb͕idi di n'etiti mu na ha; ha emeruwo kwa aha nsọm site n'ihe-árú-ha nile nke ha meworo: M'we ripia ha n'iwem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mgbe ha wuru mbata ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ mbata ọnụ ụzọ m, tinye ọnụ ụzọ ha nʼakụkụ ọnụ ụzọ m, ọ bụkwa naanị mgbidi bụ ihe dị nʼetiti mụ na ha. Ha merụrụ aha nsọ m site nʼihe arụ niile ha mere. Ya mere m ji bibie ha nʼiwe m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 43:8
13 Iomraidhean Croise  

O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka aham gādi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke oyiyi-ihe ahu, bú nke o mere, n'ulo Chineke, bú nke Chineke siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, Ṅ'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:


Ha gēwere ufọdu nime ọbara-ya, tiyekwasi ya n'awara-uzọ abua na n'ọfiere-uzọ n'ulo nile nke ha gēri ya nime ha.


N'ihi na mb͕e ha b͕uru umu-ha ndikom nye arusi nile ha, ha we bata n'ebe nsọm ubọchi ahu ime ka ọ ghara idi nsọ; ma, le, otú a ka ha meworo n'etiti ulom.


ebe unu meworo ka ndi ala ọzọ bata, bú ndi anēbighi úgwù n'obi anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, inọ n'ebe nsọm, ime ka ọ ghara idi nsọ, bú ulom, mb͕e unu nēweta nrim nso, bú abuba na ọbara, ha we mebie ọb͕ub͕a-ndum, tiyere ihe-árú nile unu.


N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na ebe nsọm ka i meruworo n'ihe-gi nile nke jọb͕uru onwe-ha, na n'ihe-árú-gi nile, n'ihi ya Mu onwem aghaghi kwa ibilata gi; anyam agaghi-eme kwa ebere; ọzọ kwa, Mu onwem agaghi-enwe ọmiko.


Otù uzọ n'uzọ atọ nime gi gānwu site n'ajọ ọria nēfe efe, ọ bu kwa site n'oké unwu ka ha gāgwusi n'etiti gi; otù uzọ n'uzọ atọ gāda site na mma-agha buruburu gi; ọzọ, otù uzọ n'uzọ atọ ka M'gāb͕asa nye ifufe nile, M'gāmiputa kwa mma-agha n'azu ha.


Ewe mezue iwem, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru ha, ewe kasiem obi: ha gāmara kwa na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu n'ekworom, mb͕e M'gēmezuwori ọnumam n'aru ha.


Onye-nwe-ya we bilie n'ututu, meghe ọnu-uzọ ulo ahu, we pua ije ije-ya: ma, le, nwayi ahu, bú iko-ya, adawo n'ọnu-uzọ ulo ahu, aka-ya abua di kwa na nbata-uzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan