Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 43:4 - Bible Nso

4 Ebube nke Jehova we bata nime ulo-Ya n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ebube Onyenwe anyị sitere nʼọnụ ụzọ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ bata nʼime ụlọnsọ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 43:4
11 Iomraidhean Croise  

Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu.


Moses apughi kwa ibà n'ulo-ikwū nzute, n'ihi na igwe-oji ahu biri n'elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu.


Bilie, nwue; n'ihi na ìhè-gi abiawo, ebube Jehova awawo kwa n'aru gi dika anyanwu.


Dika eke-na-ogwurugwu si di n'ile ya anya, bú nke di n'igwe-oji n'ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n'ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n'ile ya anya. M'we hu ya, da kpue irum n'ala, m'we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.


Ebube Jehova we si n'etiti obodo ahu rigo, guzo n'elu ugwu ahu nke di n'akuku Iru-anyanwu nke obodo ahu.


Mọ Chineke we buliem, m'we nu olu nke oké ùzù n'azum, si, Ihe agọziworo agọzi ka ebube Jehova bu site n'ọnọdu-Ya.


O we me ka m'jerue ọnu-uzọ-ama ahu, bú ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu:


ma le, ebube nke Chineke nke Israel si n'uzọ Iru-anyanwu bia: olu-Ya di kwa ka olu ọtutu miri: uwa nwu-kwa-ra enwu site n'ebube-Ya.


Jehova we sim, Ọnu-uzọ nka gābu ihe emechiri emechi, agaghi-emeghe ya, ọ dighi kwa onye ọ bula gēsi ya bata, n'ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, esiwo ya bata; o we buru ihe emechiri emechi.


O we me ka m'bia n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu n'iru ulo ahu; m'we hu, ma le, ebube Jehova juputara ulo Jehova: m'we da kpuchie irum n'ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan