Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 42:14 - Bible Nso

14 Mb͕e ndi-nchu-àjà nābà nime, ha agaghi-esi kwa n'ebe nsọ ahu puta n'ogige di n'èzí, kama n'ebe ahu ka ha gāwusa uwe-ha nke ha ji eje ozi; n'ihi na ihe nsọ ka ha bu: ha ewe yiri uwe ọzọ we biarue ihe diri ndi-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Mgbe ndị nchụaja bara nʼime ebe nsọ ahụ nke e kewapụrụ iche, ha aghaghị esikwa nʼebe ahụ pụta nʼogige mpụta ezi, tupu ruo mgbe ha yisara uwe ha yii jee ozi, nʼihi na uwe ndị a dị nsọ. Ha ga-eyiri uwe ọzọ, tupu ha abanye nʼakụkụ ụlọ ndị ahụ dịịrị ndị ọzọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 42:14
16 Iomraidhean Croise  

Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.


O we me ka m'laghachi n'uzọ ọnu-uzọ-ama nke ebe nsọ ahu nke di n'èzí, nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma ọnu-uzọ-ama ahu bu nke emechiri emechi.


Ma mb͕e ha nāpu n'ogige di n'èzí, bú ogige di n'èzí ipukuru ndi Israel, ha gēyipu uwe nile ha, nke onwe-ha nēje ozi nime ha, ha gādọba kwa ha n'ime-ulo nsọ ndia, yiri uwe ọzọ, ka ha we ghara iji uwe-ha do ndi Israel nsọ.


Eron gābata kwa n'ulo-ikwū nzute, yipu uwe ákwà ọcha ahu nile, nke o yiri mb͕e ọ batara n'ebe nsọ a, ọ gāwusa ha n'ebe ahu:


ọ gēwere kwa miri sa anu-aru-ya n'ebe di nsọ, o gēyiri kwa uwe-ya nile, puta, me àjà-nsure-ọku-ya na àjà-nsure-ọku nke ndim, kpuchiri onwe-ya, kpuchi-kwa-ra ndim, nmehie-ha.


Moses we me ka umu-ndikom Eron biaru nso, o yikwasi ha uwe-ime, were ihe ike n'úkwù ke ha, ke kwa ha ihe ike n'isi; dika Jehova nyere Moses iwu.


O tiye n'aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n'úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n'aru ya, ke ya n'ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n'aru ya.


Ma Jisus siri ya, Ọ dighi onye ọ bula nke nēle anya n'azu, mb͕e o tiyesiri aka-ya n'ọ́gù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke.


Kama yikwasinu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, unu ebu-kwa-la uzọ nēchère aru, ime ihe ọjọ nāgu ya.


ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche;


N'ihi na ka unu ra, bú ndi emere baptism ibà nime Kraist, unu yikwasiri Kraist.


Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan