Izikiel 41:6 - Bible Nso6 Ulo ntà nke akuku di kwa otù ulo ntà nke akuku n'elu ulo ntà nke akuku ọzọ okpukpu atọ, ha di kwa orú na iri n'usoro; ha we ba nime mb͕idi ahu nke diri ulo ahu bayere ulo ntà nke akuku di ya buruburu n'akuku nile, ka ha we jide mb͕idi ahu, ghara ijide mb͕idi ulo onwe-ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a6 Ọnụụlọ nta ndị a dị nʼokpukpu atọ, nke ọbụla nʼelu ibe ya, okpukpu ọbụla nwere iri ọnụụlọ atọ. E nwere mgbidi gbara aja ụlọnsọ ahụ gburugburu nʼakụkụ niile, ka ha bụrụ ihe nkwado nye ọnụụlọ nta ndị a, ka ihe nkwado ndị a ghara ịbụ ihe a rụnyere nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ. Faic an caibideil |