Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 41:22 - Bible Nso

22 Ebe-ichu-àjà-ya bu osisi, cubit atọ n'idi-elu-ya, ogologo-ya di kwa cubit abua: ọ nwe-kwa-ra nkuku-ya anọ; ogologo-ya na akuku-ya nile bu kwa osisi: o we gwam okwu, si, Nka bu table ahu nke di n'iru Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ebe ịchụ aja ya bụ nke eji osisi wuo. Akụkụ niile nke ebe ịchụ aja a ha nʼotu. Ọ dị otu mita na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita itoolu nʼakụkụ ya ọbụla. Osisi ka e ji wuo nkuku anọ ya, akụkụ ya niile, na ntọala ya. Mgbe ahụ, nwoke ahụ gwara m, “Nke a bụ tebul na-adị nʼihu Onyenwe anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 41:22
18 Iomraidhean Croise  

Ma n'iru ime-ime-ulo ahu di orú cubit n'ogologo, na orú cubit n'obosara, na orú cubit n'idi-elu-ya; ọ machita ya ọla-edo makarisiri nma: o were kwa osisi cedar machita ebe-ichu-àjà.


Ọ machita-kwa-ra ulo ahu nile ọla-edo, rue mb͕e amachitazuru ulo nile: o were kwa ọla-edo machita ebe-ichu-àjà ahu nile bu nke diri ime-ime-ulo ahu.


Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Jehova: ebe-ichu-àjà ọla-edo, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ya, ọ bu ọla-edo:


Solomon me-kwa-ra ihe nile nke di n'ulo Chineke, ebe-ichu-àjà ọla-edo kwa, na table nke achicha iru Chineke di n'elu ha;


I gēme kwa table osisi acacia: cubit abua ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.


Mb͕e Eron nēweli oriọna n'etiti ehihie na anyasi ka ọ gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ọ bu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure n'iru Jehova mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile.


O b͕uwo anu-ob͕ub͕u-ya; ọ gwawo manya-vine-ya agwa; O dowo kwa table-ya n'usoro.


Mb͕e eze nọ n'oche-ya di buruburu, Manu nard nkem sìpuru ísì utọ ya.


nọkwasi n'ihe-ndina di nsọpuru, nke table edoro n'usoro di kwa n'iru ya, ọ bu kwa ihe-nsure-ọkum nke nēsì ísì utọ na manum ka i dọbara n'elu ya.


ha onwe-ha gābata n'ebe nsọm, ha onwe-ha gābiaru kwa table nkem nso, ijerem ozi, ha gēdebe kwa ihe-ndebem.


I gēdo kwa ha n'usoro abua, isi n'otù usoro, n'elu table nke ọla-edo anāgwaghi agwa n'iru Jehova.


Ma unu onwe-unu nēme ka ọ ghara idi nsọ, n'isi, Table nke Jehova, ihe emere ka ọ ghara idi nsọ ka ọ bu, nkpuru-ya, bú ihe-oriri-Ya, bu kwa ihe-nlelì.


Unu nēweta nso achicha emere ka ọ ghara idi nsọ n'elu ebe-ichu-àjàm. Ma unu nāsi, Nìme Gini ka ayi meworo Gi ka I ghara idi nsọ? N'isi, Table nke Jehova, ihe nlelì ka ọ bu.


Unu apughi iṅu iko Onye-nwe-ayi na iko ndi-mọ ọjọ: unu apughi iketa table Onye-nwe-ayi na table ndi-mọ ọjọ.


Le, anameguzo n'ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M'gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie.


Mọ-ozi ọzọ we bia guzo n'elu ebe-ichu-àjà ahu, nēnwe ihe nke ọla-edo eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ewe nye ya ọtutu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ we tukwasi ha n'ekpere ndi nsọ nile nke di n'elu ebe-ichu-àjà ahu nke ọla-edo nke di n'iru oche-eze ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan