Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 41:18 - Bible Nso

18 Ọ bu kwa ihe emeworo ka o yie cherubim na nkwu; otù nkwu di n'etiti cherub na cherub, iru abua ka cherub ọ bula nwere;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 ka a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ. Cherubim na-esota osisi nkwụ. Osisi nkwụ ọbụla na-esotakwa cherubim. Cherub ọbụla nwere ihu abụọ:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 41:18
16 Iomraidhean Croise  

Ọ pia n'elu ha cherubim na nkwu na okoko-osisi wara awa: ọ were ọla-edo nke emere ka ọ dabà n'elu ihe eb͕uru eb͕ub͕u machita ha.


ọdum na ehi na cherubim di n'ihe-njikọ nke di n'etiti nkwukọta ahu; ihe-ndọkwasi dikwasi na nkwukọta n'elu: ihe aturu atu nke emere ka o yie ihe-nkwuba di kwa n'okpuru ọdum nile na ehi nile.


O b͕ue eb͕ub͕u cherubim na ọdum na nkwu n'elu mbadamba aka-ya nile, na n'elu ihe-njikọ-ya nile, dika ọnọdu di efu nke ebe ọ bula si di, ha na ihe aturu atu buruburu.


O were kwa osisi fir kpuchie ulo ahu nke di kari uku, o we were ezi ọla-edo kpuchie ya, tua akika nkwu na iyab͕a n'elu ya.


O were kwa ọla-edo kpuchie ulo ahu, bú ntuhie-ya nile, na nbata-uzọ-ya nile, na mb͕idi-ya nile, na ibo-ọnu-uzọ-ya nile; o b͕u-kwa-ra eb͕ub͕u cherubim na mb͕idi-ya nile.


Ma oyiyi iru nile ha, iru madu ka ha nwere; iru ọdum ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-nri; iru ehi ka ha anọ nwe-kwa-ra n'aka-ekpe; iru ugo ka ha anọ nwe-kwa-ra.


Ma iru anọ diri cherub ọ bula nime ha: otù iru bu iru cherub ahu, iru nke-abua bu iru madu, nke-atọ bu iru ọdum, nke-anọ bu iru ugo.


Iru anọ iru anọ diri cherub ọ bula, nkù anọ di-kwa-ra cherub ọ bula; oyiyi nke aka madu di kwa n'okpuru nkù-ha.


Ọzọ, window emechiri emechi diri ime-ulo nile, di-kwa-ra akuku-ọnu-uzọ nile ha n'ime ọnu-uzọ-ama buruburu n'akuku nile, otú a ka window di-kwa-ra ulo-nbata nile: window di kwa n'ime ulo buruburu n'akuku nile: nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ ọ bula.


Window-ya nile na ulo-nbata-ya nile na nkwu-ya nile di kwa ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu; ọ bu kwa ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa ka ha ji arigo nime ya; ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha.


rue elu ọnu-uzọ, ọbuná rue ulo ime-ime ya, na n'èzí, ru kwa mb͕idi-ya nile buruburu n'akuku nile n'ime na n'èzí, n'ọtùtù-ha.


Site n'ala rue elu ọnu-uzọ-ya ka cherubim na nkwu nke emere eme di: otú a ka mb͕idi nke ulo uku Chineke di.


Ihe emere n'elu ha, bú n'elu ibo-ọnu-uzọ nile nke ulo uku Chineke, bu kwa cherubim na nkwu, dika nke emere n'elu mb͕idi-ya nile; nbata-uzọ nke osisi di kwa n'iru uzọ-nbata-ya n'èzí.


Mb͕e ihe ndia gasiri m'we hu, ma le, oké ìgwè madu, nke onye ọ bula nāpughi iguta ọnu, ndi si na mba nile ọ bula, na ebo nile, na ndi nile, na asusu nile, puta, nēguzo n'iru oche-eze ahu na n'iru Nwa-aturu ahu, eb͕okwasiworo ha uwe-nwuda di ọcha, igu-nkwu di kwa n'aka-ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan