Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 41:16 - Bible Nso

16 nbata-uzọ-ya nile, na window nile emechiri emechi, na ulo-njeghari-ya nile buruburu n'okpukpu atọ ha, nke di na ncherita-iru nbata-uzọ ahu, nke ihe-nmachita nke osisi di ya buruburu n'akuku nile, site kwa n'ala rue window nile; ma window nile bu nke ekpuchiri ekpuchi;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 ya na ọnụ ụzọ ndị ahụ, na oghereikuku niile dị warawara, na ebe njegharị gbara ha atọ gburugburu, ihe niile, elu ma ala, tinyere ọnụ ụzọ bụ nke eji osisi mmachite. Ala ya, na mgbidi ya ruo na oghereikuku, ma oghereikuku niile bụkwa ihe ekpuchiri ekpuchi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 41:16
14 Iomraidhean Croise  

O were ibo osisi cedar wue mb͕idi ulo ahu nime; site n'ala ulo rue mb͕idi nke okpukpu, o were osisi machita ha nime: o were ibo osisi fir machita ala ulo.


O we mere ulo ahu window ufọdu di obosara nime, kpa kwa nkpa n'èzi.


O were kwa osisi fir kpuchie ulo ahu nke di kari uku, o we were ezi ọla-edo kpuchie ya, tua akika nkwu na iyab͕a n'elu ya.


Ntọ-ala nile nke nbata-uzọ nile we me nkpatu site n'olu onye ahu nke nākpọ òkù, ulo we juputa n'anwuru-ọku.


Ebube Jehova we si n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu pua, guzo n'elu cherubim.


Ọzọ, window emechiri emechi diri ime-ulo nile, di-kwa-ra akuku-ọnu-uzọ nile ha n'ime ọnu-uzọ-ama buruburu n'akuku nile, otú a ka window di-kwa-ra ulo-nbata nile: window di kwa n'ime ulo buruburu n'akuku nile: nkwu di kwa n'akuku-ọnu-uzọ ọ bula.


Window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile, dika window ndia: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.


O we biarue ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu, ọ rigo ihe-nrigo-ya, tùa nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu, otù ami n'obosara: ọbuná otù nbata-uzọ, otù ami n'obosara.


Ọ tù-kwa-ra ogologo nke ulo ahu anēwu ewu n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu nke di n'azu ya, na ulo-njeghari-ya n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ọgu cubit ise; na ulo uku Chineke nke ime-ime, na uzọ-nbata nile nke ogige ahu;


rue elu ọnu-uzọ, ọbuná rue ulo ime-ime ya, na n'èzí, ru kwa mb͕idi-ya nile buruburu n'akuku nile n'ime na n'èzí, n'ọtùtù-ha.


Na ncherita-iru orú cubit ahu nke diri ogige di nime, na na ncherita-iru pavement nke diri ogige di n'èzí, ka ulo-njeghari nke nēche iru n'ulo-njeghari ọzọ di n'okpukpu atọ.


Ọ̀ bu oge unu nwere, unu onwe-unu, ibi n'ulo-unu amachitara osisi, mb͕e ulo a bu nkpọnkpọ ebe?


N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan