Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 41:15 - Bible Nso

15 Ọ tù-kwa-ra ogologo nke ulo ahu anēwu ewu n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu nke di n'azu ya, na ulo-njeghari-ya n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ọgu cubit ise; na ulo uku Chineke nke ime-ime, na uzọ-nbata nile nke ogige ahu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọ tụrụ ịdị ogologo nke ụlọ ahụ chere ihu nʼogige dị nʼazụ ụlọnsọ ukwu ahụ, tinyere ebe njegharị ya nke dị nʼakụkụ abụọ ya. Ọ dị iri mita ise na atọ. Ụlọ ezumezu ahụ, nʼime ebe nsọ ahụ, na mpụta nke ọnụ ụlọ, bụ nke chere ihu nʼogige ahụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 41:15
13 Iomraidhean Croise  

Ntuhie nile nke ulo-ayi nile bu cedar, Age-ulo-ayi nile bu asisi fir.


Isi-gi nke di n'elu gi di ka Kamel, Agiri-isi nke isi-gi di kwa ka ogho ododo; Ekeworo eze ab͕u na nruda-ya nile.


Ma ulo ahu anēwu ewu nke di n'iru ebe ekewapuru ekewapu n'akuku n'uzọ Ọdida-anyanwu, obosara-ya di ọgu cubit atọ na iri; mb͕idi nke ulo ahu anēwu ewu di kwa cubit ise n'ib͕idi-ya buruburu n'akuku nile, ogologo-ya di kwa ọgu cubit anọ na iri.


Ọ tù-kwa-ra ulo ahu, ogologo-ya di ọgu cubit ise; na ebe ahu ekewapuru ekewapu, na ulo ahu anēwu ewu, na mb͕idi-ya nile, ogologo-ya di ọgu cubit ise;


na obosara nke iru ulo ahu, na nke ebe ahu ekewapuru ekewapu chere iru n'Iru-anyanwu, ọgu cubit ise.


nbata-uzọ-ya nile, na window nile emechiri emechi, na ulo-njeghari-ya nile buruburu n'okpukpu atọ ha, nke di na ncherita-iru nbata-uzọ ahu, nke ihe-nmachita nke osisi di ya buruburu n'akuku nile, site kwa n'ala rue window nile; ma window nile bu nke ekpuchiri ekpuchi;


rue elu ọnu-uzọ, ọbuná rue ulo ime-ime ya, na n'èzí, ru kwa mb͕idi-ya nile buruburu n'akuku nile n'ime na n'èzí, n'ọtùtù-ha.


O we me ka m'puta ba n'ogige ahu di n'èzí, n'uzọ ahu nke di n'uzọ Ugwu: o we me ha m'ba n'ime-ulo ahu nke di na ncherita-iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, nke di kwa na ncherita-iru ulo ahu anēwu ewu n'akuku Ugwu.


N'ib͕idi nke mb͕idi ogige n'uzọ Iru-anyanwu, n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, na n'iru ulo ahu anēwu ewu, ka ime-ulo di iche iche di.


Ma mb͕e ọ tùzusiri ulo ime-ime, o we me ka m'puta n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu, o we tùa ya buruburu n'akuku nile.


Na ncherita-iru orú cubit ahu nke diri ogige di nime, na na ncherita-iru pavement nke diri ogige di n'èzí, ka ulo-njeghari nke nēche iru n'ulo-njeghari ọzọ di n'okpukpu atọ.


Ma ime-ulo nke kachasi elu di nkpunkpu kari: n'ihi na ulo-njeghari nēbipu ihe na ndia, kari nke ha nēbipu n'ime-ulo di ala ma-ọbu n'ime-ulo etiti, n'ulo ahu anēwu ewu.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ buru na i je ije n'uzọm nile, ọ buru kwa na i debe ihe-ndebem, ọ gābu kwa na gi onwe-gi gēkpe ulom ikpe, ọzọ, i gēdebe kwa ogigem nile, M'gēnye kwa gi ebe-njeghari di iche iche n'etiti ndia nēguzo n'ebe a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan