Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 40:6 - Bible Nso

6 O we biarue ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu, ọ rigo ihe-nrigo-ya, tùa nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu, otù ami n'obosara: ọbuná otù nbata-uzọ, otù ami n'obosara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Emesịa, ọ gara nʼọnụ ụzọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ, rigoro nʼihe nrigo elu, tụọ ala ala ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ahụ. Obosara ya dị mita atọ na ọkara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 40:6
24 Iomraidhean Croise  

Ọnu-uzọ nke ulo ntà nke akuku nke-etiti di n'akuku aka-nri nke ulo ahu: ha we si n'uzọ-nrigo nke nāga buruburu nārigo n'ulo ntà nke-etiti, si kwa na nke-etiti je rue nke-atọ.


ma ha nọ rue ub͕u a n'ọnu-uzọ-ama eze n'akuku ọwuwa-anyanwu: ndi ahu bu ndi-ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū umu Livai nwere.


N'akuku anọ ka ndi-ọnu-uzọ-ama nọ, n'Ọwuwa-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida.


N'iso ha ka Zedok nwa Imea mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ya. N'iso ya ka Shemaia nwa Shekania, bú onye nēche ọnu-uzọ-ama ọwuwa-anyanwu, mere ka mb͕idi di ike.


N'ihi na otù ubọchi n'ogige-Gi nile di nma kari nnù ubọchi abua na ọgu iri n'ebe ọzọ. Arọputawom iguzo na nbata-uzọ n'ulo Chinekem, Kari ibi n'ulo-ikwū nile nke nmebi-iwu.


purue ndagwurugwu nwa Hinom, nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama ejùjù, kpọsa n'ebe ahu okwu nile nke M'gāgwa gi:


Ebube Jehova we si n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu pua, guzo n'elu cherubim.


Mọ Chineke we buliem, me ka m'biarue ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova, nke nēche iru n'Iru-anyanwu: ma, le, n'oghere nke ọnu-uzọ-ama ahu ka orú ndikom na ise nọ; m'we hu n'etiti ha Jeazanaia nwa Azua, na Pelataia nwa Benaia, bú ndi-isi nke ndi Israel.


Ọnu-uzọ-ama ahu kwa nke nēche iru n'uzọ Ugwu, bú ọnu-uzọ-ama nke ogige di n'èzí, o tùru ogologo-ya na obosara-ya.


Window-ya nile na ulo-nbata-ya nile na nkwu-ya nile di kwa ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu; ọ bu kwa ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa ka ha ji arigo nime ya; ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha.


O we me ka m'je n'uzọ Ndida, ma le, otù ọnu-uzọ-ama di n'uzọ Ndida: o we tùa akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile dika ọtùtù ndia si di.


Ihe-nrigo nke nwere nzọ-ukwu asa di kwa iji arigo ya, ulo-nbata-ya nile di kwa n'iru ha: o nwe-kwa-ra nkwu, otù n'otù akuku, otù n'akuku nke-ọzọ, n'akuku-ọnu-uzọ-ya abua.


Ma le, otù mb͕idi di n'èzí ulo ahu buruburu n'akuku nile, n'aka nwoke ahu ka amì eji atù ihe di kwa nke di cubit isi n'ogologo, cubit ọ bula bu otù cubit na otù ntù-ọbu-aka: o we tùa ib͕idi nke mb͕idi ahu anēwu ewu, otù ami; na idi-elu-ya, otù ami.


Ime-ulo ọ bula bu otù ami n'ogologo, na otù ami n'obosara; n'etiti ime-ulo abua di cubit ise; nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama n'akuku uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo bu otù ami.


nbata-uzọ-ya nile, na window nile emechiri emechi, na ulo-njeghari-ya nile buruburu n'okpukpu atọ ha, nke di na ncherita-iru nbata-uzọ ahu, nke ihe-nmachita nke osisi di ya buruburu n'akuku nile, site kwa n'ala rue window nile; ma window nile bu nke ekpuchiri ekpuchi;


Ma mb͕e ọ tùzusiri ulo ime-ime, o we me ka m'puta n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu nke iru-ya di n'uzọ Iru-anyanwu, o we tùa ya buruburu n'akuku nile.


O we me ka m'jerue ọnu-uzọ-ama ahu, bú ọnu-uzọ-ama nke nēche iru n'uzọ Iru-anyanwu:


Ngwe-ya di kwa cubit iri na anọ n'ogologo-ya, na cubit iri na anọ n'obosara-ya n'akuku anọ ya rara nrata, ókè nke di ya buruburu di kwa nkera cubit; ala o nwere di kwa otù cubit buruburu; ihe-nrigo-ya nēche iru n'Iru-anyanwu.


mb͕e ha nētiye nbata-uzọ-ha n'akuku nbata-uzọ nkem, na akuku-ọnu-uzọ-ha n'akuku akuku-ọnu-uzọ nkem, ọ bu kwa nání mb͕idi di n'etiti mu na ha; ha emeruwo kwa aha nsọm site n'ihe-árú-ha nile nke ha meworo: M'we ripia ha n'iwem.


O we me ka m'laghachi n'uzọ ọnu-uzọ-ama nke ebe nsọ ahu nke di n'èzí, nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma ọnu-uzọ-ama ahu bu nke emechiri emechi.


Ma mb͕e onye-isi gēdozi àjà-afọ-ofufo, ma ọ bu àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà-udo, iburu Jehova onyinye-afọ-ofufo, agēmeghere ya ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'Iru-anyanwu, ọ gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya na àjà-udo-ya nile, dika o si eme n'ubọchi-izu-ike: ọ gāpu kwa, ewe mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ọ pusiri.


O we me ka m'laghachi rue ọnu-uzọ ulo ahu; ma, le, miri nēsi n'okpuru nbata-uzọ nke ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu puta, n'ihi na iru ulo ahu di n'Iru-anyanwu: miri ahu nēsi kwa n'okpuru rùda, site n'akuku aka-nri nke ulo ahu, site n'akuku Ndida nke ebe-ichu-àjà.


O we me ka m'ba nime ogige di nime nke ulo Jehova, ma, le, n'ọnu-uzọ ulo uku nke Jehova, n'etiti uzọ-nbata na ebe-ichu-àjà, ka ihe ra ka orú ndikom na ise nọ, b͕akuta ulo uku nke Jehova azu-ha, che iru-ha n'akuku Iru-anyanwu; ndi ahu nākpọ kwa isi ala nye anyanwu che Iru-anyanwu iru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan