Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 40:10 - Bible Nso

10 Ime-ulo nke ọnu-uzọ-ama n'uzọ Iru-anyanwu di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; otù ọtùtù ka ha atọ nwere: ọ bu kwa otù ọtùtù ka akuku-ọnu-uzọ abua nwere n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Nʼime ọnụ ụzọ ama nke ọwụwa anyanwụ, e nwere oghere atọ dị nʼakụkụ ọbụla, oghere atọ ndị ahụ ha nʼotu. Ihu akụkụ aja ya niile nke chere ha ihu bụkwa otu nʼọtụtụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 40:10
6 Iomraidhean Croise  

O we tùa obosara nke oghere ọnu-uzọ-ama, cubit iri; na ogologo nke ọnu-uzọ-ama, cubit iri-na-atọ;


Ime-ulo-ya di atọ n'otù akuku, atọ n'akuku nke-ọzọ; akuku-ọnu-uzọ-ya abua na ulo-nbata-ya nile di ka ọtùtù nke ọnu-uzọ-ama mbu: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.


na ime-ulo-ya nile, na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, na ulo-nbata-ya nile, dika ọtùtù ndia si di: window di-kwa-ra ya, di-kwa-ra ulo-nbata-ya nile buruburu n'akuku nile: ọgu cubit abua na iri ka ogologo-ya di, obosara-ya di kwa orú cubit na ise.


Ọzọ, n'èzí ọnu-uzọ-ama di nime ka ime-ulo nke ndi-abù di n'ogige di nime, nke di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Ugwu; iru-ha di kwa n'uzọ Ndida: otù di n'akuku ọnu-uzọ-ama nke Iru-anyanwu nke iru-ya di n'uzọ Ugwu.


Ime-ulo ọ bula bu otù ami n'ogologo, na otù ami n'obosara; n'etiti ime-ulo abua di cubit ise; nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama n'akuku uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo bu otù ami.


O we tùa uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama, cubit asatọ; na akuku-ọnu-uzọ-ya abua, cubit abua; uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama chere iru n'ulo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan