Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 4:4 - Bible Nso

4 Ọzọ, gi onwe-gi were akuku aka-ekpe gi dina ala, tukwasi-ya ajọ omume ulo Israel: ka ọnu-ọgugu ubọchi ra nke i gēwere ya dina ala, i gēbu ajọ omume-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “Ugbu a, dinara ala nʼakụkụ aka ekpe gị, aga m enye gị ntaramahụhụ mmehie ndị Izrel, ị ga-ata ahụhụ mmehie ha ụbọchị niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 4:4
11 Iomraidhean Croise  

Ma Mu onwem, edoworom i arọ nile nke ajọ omume-ha ibu ọnu-ọgugu ubọchi, bú ọgu ubọchi iri-na-iteghete na iri: i gēbu kwa ajọ omume nke ulo Israel.


Ma, le, atukwasim i udọ̀, i we ghara isi n'otù akuku-aru-gi chighari n'akuku-aru-gi ọzọ, rue mb͕e i dinazuworo ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha-gi.


Gini mere unu erighi àjà-nmehie n'ebe nke ebe nsọ ahu? n'ihi na ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ bu, ọ bu kwa ya ka O nyeworo unu ibupu ajọ omume nke nzukọ Israel, ikpuchiri ha nmechie-ha n'iru Jehova.


nkpi ahu gēbu kwa n'aru ya ajọ omume-ha nile rue ala nkewapu: o gēzilaga kwa nkpi ahu n'ọzara.


Dika ọnu-ọgugu ubọchi nke unu ji ledo ala ahu anya si di, bú ọgu ubọchi abua, otù ubọchi otù arọ, otù ubochi otù arọ, otù a ka unu gēbu ajọ omume nile unu, ọgu arọ abua, unu gāma kwa iju-ajum.


Jehova we si Eron, Gi onwe-gi na umu-gi ndikom na ulo nna-gi tiyere gi gēbu ajọ omume nke ebe nsọm: gi onwe-gi na umu-gi ndikom tiyere gi gēbu kwa ajọ omume nke ọlu-nchu-àjà-unu.


ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, Ya onwe-ya nara nriaria nile ayi, būru kwa ọria nile ayi.


n'uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n'iru Chineke nání otù mb͕e iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ub͕ò abua, ma nmehie adighi ya, ka ewe zọputa ha.


Onye Ya onwe-ya, dika àjà achuru, būru nmehie nile ayi n'aru-Ya n'elu osisi ahu, ka ayi, ebe ayi nwuworo n'ebe nmehie nile di, ka ayi we di ndu n'ebe ezi omume di; Onye eji ọnyá-utari-Ya me ka unu nwe ezi ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan