Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 4:16 - Bible Nso

16 O we sim, Nwa nke madu, le, M'gaje ib͕aji nkpa-n'aka, bú achicha, nime Jerusalem: ha ewe rie achicha n'ọtùtù na nime ncheb͕u; ha gāṅu kwa miri n'ọtùtù na n'anya ọ nēju ha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, lee, aga m eme ka nri kọ na Jerusalem; ha ga-eji nchegbu rie nri a tụpụtara atụpụta, jirikwa egwu ṅụọ mmiri e kupụtara ekupụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 4:16
18 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa nke-anọ oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.


Oké unwu uku we di na Sameria: ma, le, ha nānọchigide ya n'agha, rue mb͕e anēre isi inyinya-ibu ọgu ọla-ọcha anọ na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù kab ǹsí nduru ọla-ọcha ise.


O we kpọ oké unwu ka ọ biakwasi ala ahu; Nkpa-n'aka nile, bú achicha, ka Ọ kpajiri.


I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike: I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ.


N'ihi na, le, Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēsi na Jerusalem, si kwa na Juda, wezuga ihe-ndabere na nkpa-n'aka, ihe-ndabere nile, bú nri, na ihe-ndabere nile, bú miri;


N'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa ahu, oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.


Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri; Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi: Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.


Miri-ayi ka ayi jiworo ego ṅua; Nkú-ayi nābiara ayi n'ọnu-ahia.


Ayi ji ndu-ayi n'aka weta nri-ayi N'ihi mma-agha nke ọzara.


Nwa nke madu, mb͕e ala ọ bula nēmehie megidem n'imekpu ihe-nmekpu, M'we setipu akam imegide ya, b͕ajiere ya nkpa-n'aka, bú achicha, zite oké unwu nime ya, bipu madu na anumanu nime ya;


O we sim, Le, enyewom i ǹsí ehi n'ọnọdu ǹsí madu, i gēme kwa achicha-gi n'elu ya.


mb͕e M'gēziga àkú ọjọ nile nke oké unwu n'etiti ha, bú àkú nke diri nbibi, nke M'gēziga ibibi unu; ọ bu kwa oké unwu ka M'gātukwasiri unu, M'we b͕ajiere unu nkpa-n'aka, bú achicha;


Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.


Obodo abua ma-ọbu atọ ewe ṅagharia rue otù obodo iṅu miri, ma ha adighi-aṅuju afọ: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Mb͕e Ọ saghe-kwa-ra akàrà nke-atọ, m'we nu ihe nke-atọ ahu nke di ndu, ka ọ nāsi, Bia. M'we hu, ma le, inyinya oji; onye nānọkwasi ya nwe-kwa-ra ihe-ọtùtù n'aka-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan