Izikiel 39:18 - Bible Nso18 Anu-aru ndi-dike ka unu gēri, ọ bu kwa ọbara ndi-isi nke uwa ka unu gāṅu, nke ebulu, na nke umu-aturu, na nke ewu, na nke oké-ehi, anu gbara abuba nke Beshan ka ha nile bu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a18 Anụ ahụ ndị dị ike ka unu ga-eri, ọ bụkwa ọbara ndịisi niile nke ụwa ka unu ga-aṅụ, dịka a ga-asị na ha bụ ebule na ụmụ atụrụ, na mkpi, na oke ehi, anụ mara abụba nke si na Bashan. Faic an caibideil |
Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ihi na ìgwè ewu na aturu nkem ghọrọ ihe-nluta-n'agha, ìgwè ewu na aturu nkem ewe ghọrọ anu nile ihe-oriri, n'ihi na onye-ọzùzù-aturu adighi, na n'ihi na ndi-ọzùzù-aturum achọghi ìgwè ewu na aturu nkem, kama ndi-ọzùzù-aturu nāzù onwe-ha, ma ìgwè ewu na aturu nkem ka ha nāzùghi;