Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 39:11 - Bible Nso

11 O gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gēnye Gog otù ebe ílì ozu n'Israel, bú ndagwurugwu nke ndi-ngabiga n'akuku Iru-anyanwu nke oké osimiri: ihe nēb͕ochibido ndi-ngabiga ka ọ gābu: ha gēlì kwa n'ebe ahu Gog na ìgwè ndi-ya nile: ha ewe kpọ ya, Ndagwurugwu Hamon-Gog.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m enye Gog ebe olili ya nʼIzrel, nʼime ndagwurugwu si ọwụwa anyanwụ gawa nʼụzọ oke osimiri. Ọ ga-anọchi ụzọ ndị ije nʼihi na ebe ahụ ka a ga-eli Gog na usuu ndị agha ya. Ya mere, a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Hamọn Gog.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 39:11
10 Iomraidhean Croise  

Ha we chikọba ha n'obo n'obo: ala ahu we nēsì ísì.


Nwa nke madu, che iru-gi na Gog, nke ala Megog, bú onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal, bue amuma megide ya,


ha ewe ghara ikpata nkú n'ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n'oké ọhia; n'ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n'agha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ma ọnwa asa ka ulo Israel gānọ nēlì ha, ka ha we me ka ala-ha di ọcha.


Ma ndi nāgabiga n'ala gāgabiga; mb͕e onye ọ bula gāhu ọkpukpu madu, ọ gēwu kwa ihe-iriba-ama n'akuku ya, rue mb͕e ndi nēlì ozu gēlìwo ya-ri na ndagwurugwu Hamon-Gog.


Ma akuku Iru-anyanwu, site n'etiti Hauran na Damaskọs na Gilead, na ala Israel, gābu Jọdan; site n'ókè-ala Ugwu rue oké osimiri nke Iru-anyanwu ka unu gātù. Nka bu kwa akuku Iru-anyanwu.


Ewe kpọ aha ebe ahu Kibrot-hataava: n'ihi na n'ebe ahu ka ha lìri ndi Israel ndi nāchọ ajọ ọchichọ.


ókè-ala ahu gārida kwa site na Shefam rue Ribla, n'akuku Iru anyanwu Ain; ókè-ala ahu gārida kwa, we metu akuku oké osimiri Kineret nke chere iru n'Iru-anyanwu:


Ma o rue, mb͕e ìgwè madu nādagide Ya nānu kwa okwu Chineke, na Ya onwe-ya nēguzo n'usọ ọdọ-miri Genesaret;


Mb͕e ihe ndia gasiri Jisus jere n'ofè ọzọ nke oké osimiri Galili, nke bu osimiri Taibirias.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan