Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 39:10 - Bible Nso

10 ha ewe ghara ikpata nkú n'ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n'oké ọhia; n'ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n'agha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ha agaghị akpatakwa nkụ site nʼọhịa ọzọ, maọbụ gbuta ha site nʼoke ọhịa, nʼihi na ha ga-eji ngwa agha ndị a mere ihe ịfụnwu ọkụ. Mgbe ahụ, ha ga-akwata ihe onwunwe nke ndị ahụ kwakọrọ ihe onwunwe ha nʼagha, lụtakwa ihe onwunwe nke ndị ahụ lụnara ha ihe onwunwe ha nʼike. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 39:10
13 Iomraidhean Croise  

Jehova we nye ndi Israel amara n'iru ndi Ijipt, ha we me ka ha riọta ihe. Ha we napu ndi Ijipt ihe-ha.


ma nwayi ọ bula gāriọta n'aka nwayi-ab͕ata-obi-ya, na n'aka nwayi nọ n'ulo-ya dika ọbìa, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi: unu gētiye kwa ha n'aru umu-unu ndikom na n'aru umu-unu ndinyom; unu gānapu kwa ndi Ijipt ihe-ha n'aka.


Ndi nile di iche iche gēkuru kwa ha, me ka ha biarue ọnọdu-ha: ulo Israel gēketa kwa ha n'ala Jehova ibu ndi-orù na ibu ndinyom nēje ozi: ha gāghọ kwa ndi nādọta ndi nādọta ha-ri n'agha n'agha; ha gēnwe kwa ike n'aru ndi nāchi ha-ri n'ihe-ike.


Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi.


O gēru kwa n'ubọchi ahu, na M'gēnye Gog otù ebe ílì ozu n'Israel, bú ndagwurugwu nke ndi-ngabiga n'akuku Iru-anyanwu nke oké osimiri: ihe nēb͕ochibido ndi-ngabiga ka ọ gābu: ha gēlì kwa n'ebe ahu Gog na ìgwè ndi-ya nile: ha ewe kpọ ya, Ndagwurugwu Hamon-Gog.


Ndi Jekob fọduru gādi kwa n'etiti mba nile, n'etiti ọtutu ndi di iche iche, dika ọdum n'etiti anumanu nke oké ọhia, dika nwa-ọdum n'etiti ìgwè ewu na aturu nile: nke gābu, mb͕e ọ gāgabiga, ọ gāzọda, dọkasia, ọ dighi kwa onye-nnaputa di.


N'ihi na i kwatawo ọtutu mba, ya ka ndi nile fọduru nime ndi nile di iche iche gākwata gi; n'ihi ọbara madu na ihe-ike emere ala, nke emere obodo na ndi nile bi nime ya.


Ọ̀ bu osimiri ka Jehova were oké iwe megide? Ọ̀ bu osimiri ka iwe-Gi nēmegide? Ma ọ̀ bu oké osimiri ka nrubiga-ókè nke iwe-Gi nēmegide? Na I nānọkwasi n'inyinya-Gi nile, N'ub͕ọ-ala-Gi nile nke bu nzọputa.


Ọzọ, Juda gēbuso kwa Jerusalem agha; agēkpokọta kwa àkù mba nile di buruburu, bú ọla-edo na ọla-ọcha na uwe bara uba nke-uku.


N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.


Ọ buru na ọ diri onye ọ bula ka adọta ya n'agha, ọ bu n'agha ka agādọta ya: ọ buru na onye ọ bula gēji mma-agha b͕u madu, aghaghi iji mma-agha b͕u ya. Nebe a ka ntachi-obi na okwukwe nke ndi nsọ di.


Nyeghachinu ya ọbuná dika ya onye-ya nyeghachiri madu, nye-kwa-nu ya okpukpu abua dika ọlu-ya nile di: nime iko ahu ọ kwara akwa, kwaranu ya okpukpu abua.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan