Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 38:23 - Bible Nso

23 M'gēme kwa Onwem ka M'di uku, M'gēdo kwa Onwem nsọ, me ka amara Mu onwem n'anya ọtutu mba; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Otu a ka m ga-esi gosi ịdị ukwuu m, na ịdị nsọ nke aha m. Aga m emekwa ka a mara m nʼanya mba niile dị iche iche. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 38:23
17 Iomraidhean Croise  

Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah


M'gēme kwa ka obi Fero di ike, ọ gāchu kwa ha n'azu; agāsọpuru-kwam n'aru Fero na n'aru usu-ndi-agha-ya nile; ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova. Ha we me otú a.


N'ihi nka ka ndi di ike gāsọpuru Gi, obodo nke ndi-mba ndi nēme ka madu ma jijiji gātu egwu Gi.


N'ísì utọ ka ihe-unu gātọm utọ, mb͕e M'mere ka unu si na ndi nile di iche iche puta, mb͕e M'chikọputara unu n'ala nile nke unu b͕asaworo nime ha; agēdokwam nsọ nime unu n'anya mba nile.


Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēme ka unu ba n'ala Israel, n'ala ahu nke M'weliri akam elu iwere ya nye nna-unu-hà.


si, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Zaidon; ewe sọpurum n'etiti gi: ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesiri nime ya ihe nile ekpere n'ikpe, ewe dom nsọ nime ya.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gāchikọputawori ulo Israel n'etiti ndi nile di iche iche, bú ndi ha b͕asaworo n'etiti ha, mb͕e agēdoworim nsọ nime ha n'anya mba nile, ha gēbi kwa n'elu ala-ha, nke M'nyere orùm, bú Jekob.


M'gēdo kwa aha ukum nsọ, nke emere ka ọ ghara idi nsọ n'etiti mba nile, nke unu meworo ka ọ ghara idi nsọ n'etiti ha; mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), mb͕e agēdom nsọ nime unu n'anya-ha.


Mba nile gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, Onye nēdo Israel nsọ, mb͕e ebe nsọm gādi n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.


M'gētiyekwasi kwa unu akwara, me ka anu-aru rigokwasi unu, M'gēkpuchi kwa unu akpukpọ-aru, tiye ume nime unu, unu ewe di ndu, we mara na Mu onwem bu Jehova.


i gārigo kwa imegide ndim, bú Israel, dika igwe-oji ikpuchi ala; n'ikpe-azu nke ubọchi ndia ka ọ gēru, na M'gēme ka i biakwasi alam, ka mba nile we maram, mb͕e agēdowomri nsọ nime gi n'anya-ha, gi Gog.


E, ndi nile nke ala ahu gēli ha; ọ gāghọ-kwa-ra ha aha, n'ubọchi agāsọpurum; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


M'gēdo kwa nsọpurum n'etiti mba nile, mba nile gāhu kwa ihe M'kpere n'ikpe nke M'meworo, na akam nke M'tukwasiworo ha.


mb͕e M'gēmewori ka ha si n'etiti ndi nile di iche iche lata, mb͕e M'gāchikọputawo ha-ri n'ala nile nke ndi-iro-ha, ewe dom nsọ nime ha n'anya ọtutu mba.


Aha nsọm ka M'gēme kwa ka amara ya n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-ekwe kwa ọzọ ka eme ka aha nsọm ghara idi nsọ: mba nile ewe mara na Mu onwem bu Jehova, Onye nsọ nọ n'Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan