Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 38:11 - Bible Nso

11 i gāsi kwa, M'gārigo imegide ala bu nání obodo nēnweghi mb͕idi; m'gābakwasi ndi nọ jū, ndi nọ na ntukwasi-obi, ha nile bi n'ebe nēnweghi mb͕idi, ọ dighi kwa ihe-ntuchi ma-ọbu ibo-ọnu-uzọ ha nwere:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ị ga-asị, “Aga m ebuli megide nʼala na-enweghị mgbidi, aga m awakpo ndị nọ nʼudo na-adịghị atụ anya nsogbu ọbụla, ha niile bụ ndị bi nʼebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịkwa ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 38:11
16 Iomraidhean Croise  

Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya: Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala: Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya.


Onye-iro siri, M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara: Nkpuru-obim gējuputa na ha, M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.


N'ubọchi ahu ndi-ozi gēsi n'irum pua je n'ub͕ọ di iche iche ime ka Etiopia ma jijiji, bú ndi nọ na ntukwasi-obi; ihe-nb͕ali gādi kwa n'aru ha, dika n'ubọchi Ijipt, n'ihi na, le, ọ nābia.


Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n'elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n'aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè.


N'ihi nka bue amuma, nwa nke madu, si Gog, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu mb͕e ndim, bú Israel, bi na ntukwasi-obi ka i gāmara ya?


Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n'ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n'ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n'ọtutu ndi di iche iche, n'elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n'etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.


Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;


Ma mb͕e unu gabigara Jọdan, biri n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu keta, mb͕e O mesi-kwa-ra ka unu zuru ike pua n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi;


Ndi ahu we chiri ihe nke Maika mereri, na onye-nchu-àjà nke o nwere, ha we biakwasi Laish, biakwasi otù ndi nādi jū nānọ kwa na ntukwasi-obi, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, sure obodo ahu n'ọku.


Ndikom ise ahu we je, biarue Laish, hu ndi ahu nke bi n'etiti ya, ka ha nēbi na ntukwasi-obi, dika ọme-n'ala ndi Zaidon si di, nādi jū nātukwasi kwa obi; ọ dighi kwa onye nēme ka ihere me ha n'okwu ọ bula n'ala ahu, bú onye nēnweta ike nb͕ochi, n'ebe di ndi Zaidon anya ka ha bi, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan