Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 36:2 - Bible Nso

2 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na onye-iro asiwo megide unu, Ehe! na, Ebe di elu nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga aghọworo ayi ihe-nnweta:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị iro unu ekwuola megide unu sị, “Ahaa! Ebe niile dị elu nke mgbe ochie aghọọla ihe nnweta anyị.” ’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 36:2
13 Iomraidhean Croise  

O we wue ebe nsọ Ya dika ebe di elu, Dika uwa nke Ọ tọrọ ntọ-ala-ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Chinekem, me ka ha di ka ihe nke ifufe nēfeghari buruburu, Dika ahihia n'iru ifufe.


mb͕e ahu ihe Jehova gātọ gi utọ; M'gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa dika inyinya; M'gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.


Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n'obodo-ya nile?


si umu Amon, Nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i siri, Ehe, megide ebe nsọm, mb͕e emere ya ka ọ ghara idi nsọ; na imegide ala Israel, mb͕e ọ tọb͕ọrọ n'efu; na imegide ulo Juda, mb͕e ha gara ije biri n'ala ọzọ:


Nwa nke madu, n'ihi na Taia ekwuwo okwu megide Jerusalem, si, Ehe, etipiawo ya, bú obodo nke bu ọnu-uzọ ndi nile di iche iche; o chighariwo n'ebe m'nọ: m'gēju eju, emewo ya nkpọnkpọ ebe:


N'ihi na i siwo, Mba abua ndia na ala abua ndia gābu nkem, ayi gēnweta kwa ya; ma Jehova nọrọ n'ebe ahu:


I gāma kwa na Mu onwem, bú Jehova, anuwo okwu-nlelì-gi nile nke i kwuworo megide ugwu nile nke Israel, si, Ha bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ayi ka ewereworo ha nye ka ayi we ripia ha.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buere ugwu nile nke Israel amuma, si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Jehova.


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ezie n'ọku nke ekworom ka M'kwuworo okwu megide mba nile fọduru, megide kwa Edom nile, ndi wereworo alam nye onwe-ha ibu ihe-nnweta n'ọṅù nke obi-ha nile, nime nlelì nke nkpuru-obi-ha, ka ha we chupu ya ka ọ ghọ ihe-nluta-n'agha:


Abàla n'ọnu-uzọ-ama ndim n'ubọchi nhuju-anya-ha; gi onwe-gi elekwasi-kwa-la ihe ọjọ ha anya n'ubọchi nhuju-anya-ha, unu atukwasi-kwa-la aka n'àkù-ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.


Jehova, bú Onye-nwe-ayi, bu ikem, Ọ nēme kwa ukwum abua ka ha di ka ukwu ele, Ọ bu kwa n'ebem nile di elu ka Ọ gēme ka M'zọ ije. Ọ diri Onye-isi Abù, n'ubọ-akwaram nile.


Ọ nēme ka ebe di elu nke uwa būru ya dika inyinya, Ọ we rie ihe-ọmume nke ubi; O me-kwa-ra ya ka ọ mia manu-aṅu site na nkume di elu, Na manu site n'oké nkume ọ́mú;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan