Izikiel 34:8 - Bible Nso8 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ihi na ìgwè ewu na aturu nkem ghọrọ ihe-nluta-n'agha, ìgwè ewu na aturu nkem ewe ghọrọ anu nile ihe-oriri, n'ihi na onye-ọzùzù-aturu adighi, na n'ihi na ndi-ọzùzù-aturum achọghi ìgwè ewu na aturu nkem, kama ndi-ọzùzù-aturu nāzù onwe-ha, ma ìgwè ewu na aturu nkem ka ha nāzùghi; Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, ebe unu hapụrụ igwe atụrụ m na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ, mee ka ha ghọọrọ anụ ọhịa ihe oriri, ebe unu na-achọgharịghị ha, kama unu nọ na-enyeju onwe unu afọ, ma hapụ igwe atụrụ m ka agụụ gbuo ha, Faic an caibideil |
n'ihi nka, unu ugwu Israel, nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile na nkpọnkpọ ebe nile nke tọb͕ọrọ n'efu na obodo nile anapuru anapu, nke ghọwo-kwa-ra mba nile fọdurunu nke di buruburu ihe-nluta-n'agha na ihe-ikwa-emò: