Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 34:4 - Bible Nso

4 Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n'ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Unu anaghị eme ka ndị na-adịghị ike dị ike, maọbụ gwọọ ndị na-arịa ọrịa, maọbụ kechie ọnya ndị merụrụ ahụ. Unu adịghị akpọghachite ndị kpafuru akpafu, maọbụ pụọ ịchọ ndị furu efu. Kama naanị aka ike ka unu ji na-achị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 34:4
24 Iomraidhean Croise  

N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.


ọ gēweli olu-ya n'ubọchi ahu, si, M'gaghi-abu onye-nkechi; n'ihi na ọ dighi nri di n'ulom, ọ dighi kwa uwe-nb͕okwasi: unu agaghi-edom onye-ikpe ndi-ayi.


Ndi-nche-ya bu ndi-ìsì, ha nile amaghi ama; ha nile bu nkita dara ob͕i, ha apughi ib͕ọ uja; ha bu ndi nārọ nrọ, nēdina ala, nāhu itu-òrù-ura n'anya.


Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n'efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya;


Ọ̀ dighi balm di na Gilead? ọ̀ dighi dibia nọ n'ebe ahu? ọ̀ bu kwa gini mere anu-aru ọhu nējighi epuchi n'aru ada ndim?


Nwa-ọdum ahu we jegharia n'etiti ọdum, nwa-ọdum ka ọ ghọrọ: o we muta idọb͕u anu-ndọb͕u, madu ka o riri.


O we mata ulo ọma nile nke ala ahu, ọ bu kwa obodo nile ha ka o mere nkpọnkpọ ebe; ala ahu na ùjú-ya we tọb͕ọrọ n'efu, site n'olu nke nbib͕ọ-ya.


Ha we tiye ya n'ulo-nmechibido na nb͕a-aka-imi, me ka ọ biakute eze Babilon; ha nēme ka ọ ba n'ebe ewusiri ike, ka ewe ghara inu kwa olu-ya ọzọ n'ugwu nile nke Israel.


Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi.


Ewela nkpab͕u zọda ya; ma tua egwu Chineke-gi.


kama jekurunu aturu furu efu nke ulo Israel.


Ndi-ọlu-ubi ahu we jide ndi-orù-ya, pia otù onye ihe, b͕u kwa nke-ọzọ, tu kwa nke-ọzọ nkume.


ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndi-orù-ibe-ya aka, so kwa ndi nāṅubiga manya ókè nēri nāṅu kwa;


Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu nile, O nwere ọmiko n'aru ha, n'ihi na anēsob͕u ha, nāchusa kwa ha, dika aturu nēnweghi onye nāzù ha.


Ọ bughi na ayi bu ndi-nwe okwukwe-unu, kama ayi bu ndi soro unu nālu ọṅù-unu: n'ihi na unu ji okwukwe-unu guzo.


N'ihi nka menu aka nēruda eruda na ikperè nwuworo anwu ka ha guzozie:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan