Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 34:16 - Bible Nso

16 Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Aga m achọ ndị furu efu nʼime ha, ndị kpafuru akpafu, kpọghachite ha nʼụlọ. Aga m ekechi ọnya ndị merụrụ ahụ, meekwa ka ọ dị ike. Ma ndị mara abụba na nke ndị ahụ dị ike ka m ga-ala nʼiyi. Aga m eji ikpe ziri ezi zụọ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 34:16
33 Iomraidhean Croise  

Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu, Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha.


O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe, O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n'ala.


N'ìhi gini ka aganēti unu ihe rue ub͕u a, na unu nēwezuga onwe-unu kari? isi nile ọ bula nāria ọria, aru adighi kwa obi nile ọ bula ike.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, gēziga ọtita-aru n'etiti ndi-ya mara abuba: ọ bu kwa n'okpuru nsọpuru-ya ka agāmuye nmuye dika nmuye nke ọku.


Dika onye-ọzùzù-aturu ka Ọ gāzù ìgwè aturu-Ya, n'ogwe-aka-Ya ka Ọ gāchikọta umu-aturu, ọ bu kwa n'obi-Ya ka O gēkuru ha, Ọ gēwere nwayọ nēdu ndi nēnye umu ara.


M'gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.


Umu-aturu gāta kwa nri dika ọ bu n'ọzara-ha, ndi-ọbìa gērichapu kwa nkpọnkpọ-ebe nile nke ndi ahu mara abuba.


Dọm aka na nti, Jehova, ma nání n'ikpé; adọlam aka na nti n'iwe-gi, ka I we ghara ibilatam.


N'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ndia, si: Le, M'gaje ime ka ha rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí; n'ihi na ndi-amuma nke Jerusalem ka nmeru puworo je rue ala nka nile.


Le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka Ihe-opupú nke nēme ezi omume biliere Devid, otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnwe kwa uche, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume n'ala nka.


Le, M'gaje ime ka ha si n'ala Ugwu bia, M'gāchikọputa kwa ha na nsọtu nile nke uwa, n'etiti ha ka onye-ìsì na onye-ngwurọ na nwanyi di ime na nwanyi ime nēme gānọ n'otù: na nkpọkọta uku ka ha gālata n'ebe a.


N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;


Ìgwè ewu na aturu nāla n'iyì ka ndim buworo: ndi-ọzùzù-aturu-ha emewo ka ha kpafue, n'ugwu di iche iche ka ha meworo ka ha laghachi azu: site n'ugwu rue ugwu ntà ka ha jeworo, ha echezọwo ebe-nmakpu-ha.


n'ihi nka ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ji si otú a, Le, M'gaje ime ka ha, bú ndi nka, rie wormwood, M'gēme kwa ka ha ṅua miri ńsí.


M'gēji kwa aka di ike, ji kwa ogwe-aka esetiri eseti, ji kwa ọnuma awusiri awusi, me ka unu si na ndi nile di iche iche puta, chikọputa kwa unu n'ala nile ebe unu b͕asaworo:


Were aturu arọputara arọputa n'ìgwè ewu na aturu, tukọba kwa ọkpukpu n'okpuru ya: me ya ka ọ b͕ọ nke-ọma; ka esi kwa ọkpukpu-ya nile n'etiti ya.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, M'gāchọ kwa ìgwè ewu na aturu nkem, chọputa ha.


Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n'ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha.


Anu-aru ndi-dike ka unu gēri, ọ bu kwa ọbara ndi-isi nke uwa ka unu gāṅu, nke ebulu, na nke umu-aturu, na nke ewu, na nke oké-ehi, anu gbara abuba nke Beshan ka ha nile bu.


N'ihi nka ka Ọ gārara ha nye, rue mb͕e nwanyi ime nēme gāmuwori nwa: umu-nne-ya ndi fọduru afọdu ewe laghachikute umu Israel.


Were nkpa-n'aka-Gi zùa ndi-Gi, bú ìgwè ewu na aturu nke ihe-nketa-Gi, ndi bi iche, n'oké ọhia n'etiti Kamel: ka ha ta nri nime Beshan na Gilead, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Le, M'ganēmeso ndi ahu nile, bú ndi nēweda gi n'ala, na mb͕e ahu: M'gāzọputa kwa nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi, ọ bu kwa nwanyi nke achupuru achupu ka M'gāchikọta; M'gēme kwa ka ha ghọ otuto, ghọ kwa aha, bú ndi ihere-ha di n'uwa nka nile.


N'aru ndi-ọzùzù-aturu ka iwem di ọku, ọ bu kwa nkpi nile ka M'gēji nmehie-ha leta: n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha eletawo ìgwè ewu na aturu-Ya, bú ulo Juda, Ọ gēme kwa ha ka ha di ka inyinya-Ya di ebube n'agha.


Ma Ọ zara, si, Eziteghm ma-ọbughi ijekuru aturu furu efu nke ulo Israel.


Mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma: abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.


N'ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu.


Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan