Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 33:8 - Bible Nso

8 Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mgbe m na-asị onye ajọ omume, gị onye na-emebi iwu, ị ghaghị ịnwụ! Ọ bụrụ na ị kwughị okwu, ime ka o chigharịa site nʼụzọ ya pụta, onye ahụ na-emebi iwu ga-anwụ nʼihi mmehie ya niile, ma nʼaka gị ka m ga-ajụta ọbara ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 33:8
17 Iomraidhean Croise  

ma nkpuru nke sitere n'osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n'ihi na n'ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu.


Agwọ we si nwayi, Ọ dighi ọnwu unu nāghaghi inwu:


Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ: Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.


ma ọ gaghi-adiri onye nēmebi iwu nma, ọ gaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo, bú nke di ka onyinyo; n'ihi na ọ dighi-atu egwu n'iru Chineke.


Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.


Ma nna-ya, n'ihi na ọ meb͕uru nke-uku, punara nwa-nne-ya ihe n'ike, me ihe nke nādighi nma n'etiti ndi-ya, le, ọ gānwu kwa n'ajọ omume-ya.


Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya.


Le, nkpuru-obi nile, Mu nwe ha; dika nkpuru-obi nna si di, otú a ka nkpuru-obi nwa-ya di kwa, Mu nwe ha; nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu.


Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; ma i dọghi ya aka na nti, i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ nmebi-iwu ya puta, ime ka ọ di ndu; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.


Ọzọ, mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; o we si na nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume;


Ma onye-nche ahu, mb͕e ọ gāhu mma-agha ahu ka ọ nābia, ma ọ fùghi opì-ike, ewe ghara idọ ndi-ya aka na nti, mma-agha ahu abia, wepu madu ọ bula n'etiti ha; onye ahu, n'ihi ajọ omume-ya ka ewepuworo ya, ma n'aka onye-nche ahu ka M'gājuta ọbara-ya.


Nna-ayi nwuru n'ọzara, ma ya onwe-ya adighi n'etiti nzukọ ahu ndi nēzukọ imegide Jehova nime nzukọ Kora: ma nime nmehie nke aka ya ka ọ nwuru: ma ọ dighi umu-ndikom o nwere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan