Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 33:6 - Bible Nso

6 Ma onye-nche ahu, mb͕e ọ gāhu mma-agha ahu ka ọ nābia, ma ọ fùghi opì-ike, ewe ghara idọ ndi-ya aka na nti, mma-agha ahu abia, wepu madu ọ bula n'etiti ha; onye ahu, n'ihi ajọ omume-ya ka ewepuworo ya, ma n'aka onye-nche ahu ka M'gājuta ọbara-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ma ọ bụrụ na onye nche elepụ anya hụ ndị agha ka ha na-abịa hapụ igbu opi ịdọ ndị mmadụ aka na ntị, ọnwụ ha dị nʼisi ya. Ha ga-anwụ nʼime mmehie ha, ma aga m ajụta ọbara ha site nʼaka onye nche ahụ.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 33:6
13 Iomraidhean Croise  

Reuben we za ha, si, Agwaghi m unu okwu, si, Unu emehiela megide nwa ahu; ma unu anughi? ọzọ kwa, ọbara-ya, le, anājuta ya.


N'ezie ọbara-unu, bú nke diri ndu-unu, ka M'gajuta kwa; n'aka anu nile ọ bula di ndu ka M'gājuta ya: ọ bu kwa n'aka madu, n'aka nwa-nne madu ọ bula, ka M'gājuta ndu madu.


M'gēsi aṅa ghara ime kari otúa, mb͕e ndikom ndi nēmebi iwu b͕uworo onye ezi omume n'ulo-ya n'elu ihe-ndina-ya? Ma ub͕u a m'gaghi-ajuta ọbara-ya n'aka-unu kpochapu unu n'uwa?


Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu.


N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere ndi-amuma ahu ndi nēbu amuma n'aha m, ma Mu onwem eziteghi ha, ma ha onwe-ha nāsi, Mma-agha na oké unwu agaghi-adi n'ala nka: Ọ si, Agēji mma-agha, ji kwa oké unwu, me ka ndi-amuma ahu gwusia.


Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya.


ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide ndi-ọzùzù-aturu; M'gājuta kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'aka-ha, me ka ha kwusi izù ìgwè ewu na aturu ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-azù kwa onwe-ha ọzọ; M'gānaputa kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'ọnu-ha, ka ha we ghara ighọrọ ha ihe-oriri.


Ma mb͕e ha nēdo onwe-ha n'usoro imegide ya, nēkwulu kwa ya, o fecha uwe-ya, si ha, Ọbara-unu di n'isi-unu; mu onwem di ọcha: site n'ub͕u a m'gāgakuru ndi mba ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan