Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 33:3 - Bible Nso

3 ọ we hu mma-agha ahu ka ọ nābiakwasi ala-ya, o buru na ọ fùa opì-ike-ya, dọ ndi-ya aka na nti;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 onye ga-ahụ mma agha ka ọ na-abịakwasị ala ahụ, ọ bụrụ na o gbuo opi ike, ịdọ ndị bi na mba ahụ aka na ntị banyere mma agha nke na-abịa,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 33:3
12 Iomraidhean Croise  

ndi nālu mb͕idi kwa, nwoke ọ bula na mma-agha-ya ekeworo n'úkwù-ya nọ, ha we nālu mb͕idi otú a. Onye nāfù opì-ike nọ kwa n'akukum.


N'ebe ọ bula unu nuru olu opì-ike, n'ebe ahu ka unu gāchikọta onwe-unu n'ebe ayi nọ; Chineke-ayi gēburu ayi agha.


Were akpiri kpọ nkpu, eb͕ochila, welie olu-gi dika opì-ike, we gosi ndim njehie-ha, gosi kwa ulo Jekob nmehie-ha.


Gosinu na Juda, me-kwa-nu ka anuru ya na Jerusalem; si-kwa-nu, Fùanu opì-ike n'ala nka: kpọzuenu nkpu, si, Chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba kwa n'obodo nile ewusiri ike.


Bulienu ọkọlọtọ n'ala ahu, fùanu opì-ike n'etiti mba nile, donu mba di iche iche nsọ imegide ya, menu ka ala-eze, bú Ararat, na Mini, na Ashkenaz, nuru, zukọ imegide ya: menu ka otù ọchi-agha buru onye-nlekọta imegide ya; menu ka inyinya rigota dika igurube di egwu.


Laghachinu n'ulo ọsọsọ, unu umu Benjamim, site n'etiti Jerusalem, fù-kwa-nu opì-ike nime Tekoa, buli-kwa-nu ihe-nbuli n'elu Bet-hakarem: n'ihi na ihe ọjọ si n'Ugwu eleputa anya, ya na ntipia uku.


Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti, ma o sighi na nmebi-iwu-ya na n'uzọ nmebi-iwu ya chigharia, onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.


Tiye opì-ike n'okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n'ihi na ha agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide.


Fùanu opì-ike nime Zaion, ti-kwa-nu nkpu agha n'ugwu nsọm; ka ndi nile ndi bi n'ala nka ma jijiji: n'ihi na ubọchi Jehova nābia, n'ihi na ọ di nso;


Àgāfù opì-ike n'obodo, ndi-ya aghara ima jijiji? ihe ọjọ, ọ̀ gādi n'obodo, ma Jehova emeghi ya?


N'ihi na asi kwa na opì nāda nke anāmaghi isi-ya, ònye gākwadebe onwe-ya ije agha?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan