Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 33:12 - Bible Nso

12 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si umu ndim, Ezi omume nke onye ezi omume agaghi-anaputa ya anaputa n'ubọchi njehie-ya; ọzọ, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu, ọ gaghi-asu ngọngọ nime ya n'ubọchi o si na nmebi-iwu-ya chigharia: ọzọ kwa, onye ezi omume apughi idi ndu nime ya n'ubọchi o mehiere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, gwa ndị ala gị, ‘Ezi omume nke onye na-eme ezi ihe agaghị azọpụta ya ma ọ bụrụ na ọ tụgharịa, mee ihe ọjọọ. Otu a kwa, mmehie niile nke onye na-emebi iwu agaghị eme ka ọ laa nʼiyi ma ọ bụrụ na o chegharịa pụọ site na mmehie.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 33:12
14 Iomraidhean Croise  

ọ buru na ndim, bú ndi akpọkwasiri ha aham, eweda onwe-ha n'ala, kpe ekpere, chọ irum, si n'uzọ ọjọ ha nile laghachi; Mu onwem gēsi kwa n'elu-igwe nuru, b͕aghara ha nmehie-ha, me ka ala-ha diri ndu.


ọ buru na o me ihe jọrọ njọ n'anyam, we ghara ige nti n'olum, M'gēchèghari kwa n'ezi ihe ahu, nke M'siri na M'gēji me ya nma.


ọ buru na mba ahu nke M'kwuworo okwu bayere ya esi n'ihe ọjọ ya chigharia, M'gēchèghari kwa n'ihe ọjọ ahu nke M'chère ime ya.


Ma onye nēmebi iwu, mb͕e ọ gēsi na nmehie-ya nile nke o meworo chigharia, debe ukpurum nile, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.


Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; ma i dọghi ya aka na nti, i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ nmebi-iwu ya puta, ime ka ọ di ndu; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.


Nwa nke madu, gwa umu ndi-gi okwu, si ha, Ala ọ bula, mb͕e M'nēme ka mma-agha biakwasi ya, ma ndi ala ahu eweputawo otù onye n'etiti ha, me ya ka ọ ghọrọ ha onye-nche:


Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di.


Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke;


Umu-ntakirim, ihe ndia ka m'nēdegara unu n'akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n'ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan