N'ihi na emewom ka ujọ-ya di n'ala ndi di ndu: agēme kwa ka o dina n'etiti ndi anēbighi úgwù, ya na ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
Nwa nke madu, gwa umu ndi-gi okwu, si ha, Ala ọ bula, mb͕e M'nēme ka mma-agha biakwasi ya, ma ndi ala ahu eweputawo otù onye n'etiti ha, me ya ka ọ ghọrọ ha onye-nche: