Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 32:30 - Bible Nso

30 N'ebe ahu ka ndi-isi Ugwu nọ, ha nile, na ndi Zaidon nile, ndi soro ndi eb͕uru eb͕u rida; n'ujọ-ha nke ha mere ka atua site n'idi-ike-ha ka ihere nēme ha; ha ewe soro ndi ejiri mma-agha b͕u dina n'ebighi-úgwù, būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 “Ndịisi nke mba ndị ugwu, na ndị Saịdọn niile nọ nʼebe ahụ. Ụjọ niile nke ha sitere nʼisiike ha menye ndị mmadụ egbochighị ha iketa oke nʼihere nke iso ndị e gburu egbu nwụọ. Ha soro ndị eji mma agha gbuo dinaa na-ebighị ugwu, buru ihere ha, ha na-arịdaru nʼolulu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 32:30
11 Iomraidhean Croise  

N'ihi na, le, M'gaje ikpọ ab͕uru nile nke ala-eze nile nke Ugwu òkù, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta; ha gābia kwa, do, onye ọ bula oche-eze-ya, n'oghere ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem, na imegide mb͕idi-ya nile buruburu, na imegide obodo nile nke Juda.


na eze nile nke Taia, na eze nile nke Zaidon, na ndi-eze nke agwe-etiti nke di n'ofè oké osimiri;


na eze nile nke Ugwu, ma ndi bi nso ma ndi bi n'ebe di anya, onye na ibe-ya; na ala-eze nile nke uwa, nke di n'elu uwa: eze Shishak gāṅuso kwa ha.


M'gēme kwa ka i rida, gi na ndi nārida n'olùlù, ijekuru ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, M'gēme kwa ka i bi n'ala di n'okpuru uwa, n'ebe di nkpọnkpọ site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, gi na ndi nārida n'olùlù, ka madu we ghara ibi nime gi; M'gētiye kwa ima-nma n'ala ndi di ndu:


Ọnwu nke ndi anēbighi úgwù ka i gānwu site n'aka ndi ala ọzọ: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Nwa nke madu, che iru-gi n'ebe Zaidon di, bue amuma megide ya,


N'ihi na Mu onwem gēzite ajọ ọria nēfe efe na ọbara nime ya n'èzí-ya nile; ndi eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti ya mb͕e mma-agha di n'aru ya buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


I gēsi kwa n'ebe-gi, n'akuku nile nke Ugwu dikarisiri anya, bia, gi onwe-gi, na ọtutu ndi di iche iche so gi, ndi nānọkwasi inyinya ka ha nile bu, ha bu nkpọkọta madu di uku na usu-ndi-agha bara uba:


Goma na usu-ndi-agha-ya nile; ulo Togama nke akuku Ugwu dikarisiri anya, na usu-ndi-agha-ya nile: ọbuná ọtutu ndi di iche iche so gi.


M'gēchighari kwa gi, duru gi, me ka i si n'akuku nile dikarisiri anya nke Ugwu rigota; M'gēme kwa ka i bia n'elu ugwu nile nke Israel:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan