Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 32:26 - Bible Nso

26 N'ebe ahu ka Meshek na Tubal na ìgwè ndi-ya nile nọ; n'ebe nile nke di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na ha mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 “Meshek na Tubal nọkwa nʼebe ahụ, ha na usuu ndị agha ha niile, gburugburu ili ha. Ha niile bụkwa ndị a na-ebighị ugwu, ndị e ji mma agha gbuo, nʼihi na ha mere ka oke egwu ha dị nʼala ndị dị ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 32:26
11 Iomraidhean Croise  

na Resen n'etiti Nineve na Kala (nke ahu bu obodo uku ahu).


Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras.


Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras.


M'gēdo kwa ihe-iriba-ama n'etiti ha, si kwa n'etiti ha ziga ndi b͕aputara ab͕aputa ka ha jekuru mba nile, bú Tashish, na Pul, na Lud, ndi nādọ uta, jekuru Tubal na Jevan, jekuru agwe-etiti nile di anya, ndi nānughi ihe bayerem, ndi nāhughi kwa ebubem: ha gēgosi ebubem n'etiti mba nile.


Jevan, na Tubal, na Meshek, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: madu onwe-ha na ihe di iche iche nke ọla ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi.


Ha agaghi-esoro ndi-dike dina, bú ndi dara ada site na ndi anēbighi úgwù, ndi ridaworo n'ala-mọ chiri ihe-agha-ha, ha we tọb͕ọrọ mma-agha-ha n'okpuru isi-ha, ajọ omume nile ha dikwasi n'ọkpukpu-ha; n'ihi na ujọ ndi-dike ka ha bu n'ala ndi di ndu.


N'ihi na emewom ka ujọ-ya di n'ala ndi di ndu: agēme kwa ka o dina n'etiti ndi anēbighi úgwù, ya na ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma megide Gog, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, Gog, onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan