Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 32:22 - Bible Nso

22 N'ebe ahu ka Asiria na nkpọkọta ndi ya nile di; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 “Nʼebe ahụ ka Asịrịa na ndị agha ya niile nọ; ili ndị niile o gburu egbu gbara ya gburugburu, bụ ndị niile nwụrụ site na mma agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 32:22
13 Iomraidhean Croise  

na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya.


N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.


Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi.


N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.


N'ebe ahu ka Meshek na Tubal na ìgwè ndi-ya nile nọ; n'ebe nile nke di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na ha mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu.


Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n'aha-gi: n'ulo chi-gi nile ka M'gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M'gēdo ílì-gi; n'ihi na elelìwo gi anya.


Ma ub͕ọ ufọdu gēsi n'akuku Kitim bia, Ha gēweda kwa Asiria n'ala, weda kwa Iba n'ala, Ọzọ kwa, ya onwe-ya gābiaru ila-n'iyì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan