Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 30:2 - Bible Nso

2 Nwa nke madu, bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Kwasienu ákwá ike, si, Azib͕a ub͕ochi ahu!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “ ‘Kwasienụ akwa ike ma sị, “Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 30:2
17 Iomraidhean Croise  

kwasienu ákwá ike; n'ihi na ubọchi Jehova di nso; dika nbibi nke sitere n'aka Onye puru ime ihe nile ka ọ gābia.


Kwasie ákwá ike, gi ọnu-uzọ-ama; tie nkpu, gi obodo; i b͕azewo, Filistia, ka i ra; n'ihi na n'Ugwu ka anwuru-ọku si bia, ọ dighi kwa onye ọ bula nēguzo iche na mb͕e-ya nile akara àkà.


Ọ rigowo n'ulo, ọbuná Dibon, n'ebe-ya di elu, ikwa ákwá: n'aru Nebo na n'aru Medeba ka Moab nākwasi ákwá ike: n'isi-ha nile ka nkwọcha-isi di, afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo.


N'ihi nka ka Moab gākwasiri Moab ákwá ike, ọ gākwasi ákwá ike, ka ọ ra: iri mbadamba nkpuru-vine nke Kia-hareset ka unu gātamu ntamu, ebe unu bu nání ndi apiaworo ihe.


Ibu eboro Taia. Kwasienu ákwá ike, unu ub͕ọ nke Tashish; n'ihi na ebibiwo ya, ulo we ghara idi ya, uzọ-nbata ghara kwa idi ya: esiwo n'ala Kitim kpughere ha ya.


Gabiganu rue Tashish; kwasienu ákwá ike, unu ndi bi n'ala di oké osimiri buruburu.


le, ndi-orùm gēti nkpu ọṅù site n'obi di nma, ma unu onwe-unu gēti nkpu site n'ihe-nb͕u nke obi, unu gēsite kwa na ntiwa nke mọ-unu kwasi ákwá ike.


N'ihi nka kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tienu aka n'obi, kwasi kwa ákwá ike: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n'aru ayi laghachi.


Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n'Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n'ala ahu gākwasi kwa ákwá ike.


Tie nkpu, kwasie ákwá ike, nwa nke madu: n'ihi na nke ahu di n'aru ndim, nke ahu di n'aru ndi-isi Israel: ndi arara nye mma-agha ka ha na ndim bu: n'ihi nka tie aka n'apata-ukwu-gi.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


Ka ihere me unu, ndi-ubi, kwasienu ákwá ike, unu ndi-ubi-vine, bayere ọka wheat, baye-kwa-ra ọka barley; n'ihi na owuwe-ihe-ubi alawo n'iyì.


Tetanu, unu ndi nāṅubiga manya ókè, kwanu ákwá; kwasi-kwa-nu ákwá ike, unu nile ndi nāṅu manya-vine, n'ihi manya utọ; n'ihi na ebipuwo ya n'ọnu-unu.


Kwasienu ákwá ike, unu ndi bi na Maktesh, n'ihi na ndi Kenean nile alawo n'iyì: ebipuwo ndi nile eboro ọla-ọcha.


Kwasie ákwá ike, gi osisi fir, n'ihi na osisi cedar adawo, n'ihi na emebiwo osisi nke mab͕uru onwe-ha: kwasienu ákwá ike, unu osisi oak nke Beshan, n'ihi na oké ọhia alùgh-alù adawo.


Genu nti, unu ndi-ọgaranya, kwa ákwá, ti-kwa-nu nkpu n'ihi ihuju-anya nile unu nke nābiakwasi unu.


ka ha nēguzo n'ebe di anya n'ihi egwu nke nmekpa-aru-ya, nāsi, Ahuhu, ahuhu, obodo uku ahu, Babilon, bú obodo ahu di ike! n'ihi na n'otù oge hour ka ikpé-gi biara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan