Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 30:12 - Bible Nso

12 M'gēme kwa ka osimiri Nail nile ghọ ebe kpọrọ nku, M'gēre kwa ala ahu n'aka ndi ọjọ, me ka ala ahu na ùjú-ya tọb͕ọrọ n'efu, site n'aka ndi ala ọzọ: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ. Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ. Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 30:12
12 Iomraidhean Croise  

Onye ahu Nke nāsi ob͕u-miri, Takọ; osimiri-gi nile ka M'gēme kwa ka ha tachasia:


Ọkpukpọ-nku di n'ebe miri-ya nile di, ha gāta kwa ata: n'ihi na ala arusi di iche iche apiri api ka ọ bu, ha ji kwa ihe-egwu nile ha wi ara.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ikpe ọnu-gi, bọ̀ ọ́bọ̀-gi; M'gēme kwa ka oké osimiri-ya tasia, me kwa ka isi-iyi-ya takọrọ.


Ọnwu nke ndi anēbighi úgwù ka i gānwu site n'aka ndi ala ọzọ: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Kwue okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Fero, eze Ijipt, bú ogologo anu ahu nke nāmakpu n'etiti osimiri Nail-ya nile, nke siworo, Mu nwe Nail nkem, ọ bu kwa mu onwem mere ya n'onwem.


Ndi ala ọzọ, bú ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji, we bipu ya, tusa ya: n'elu ugwu nile na nime ndagwurugwu nile ka alaka-ya daworo, ewe nyajie alaka-ya nile nke akwukwọ-ha kpuchiri ha n'ebe nile miri si erù nke ala-ya; ndi nile nke ala ahu esiwo kwa na ǹdò-ya rida, ha we tusa ya.


Ọ nābasiri oké osimiri nba ike, me ka ọ ta, ọ bu kwa osimiri nile ka O meworo ka ha takọrọ: Beshan nātalata, ya na Kamel, ihe-opupú nke Lebanon nātalata kwa.


n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya.


Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia.


Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, ha we punara ha ihe, O renye kwa ha n'aka ndi-iro-ha gburugburu, ha apughi kwa iguzo n'iru ndi-iro-ha ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan