Ọ gābia kwa, tib͕ue ala Ijipt; ndi diri ọnwu ka agēnye n'ọnwu, ndi diri ndọta-n'agha ka agēnye na ndọta-n'agha, ndi diri mma-agha ka agēnye na mma-agha.
N'ihi na emewom ka ujọ-ya di n'ala ndi di ndu: agēme kwa ka o dina n'etiti ndi anēbighi úgwù, ya na ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.