Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 3:9 - Bible Nso

9 Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Aga m emekwa ka egedege ihu gị dị ka nkume siri ike, sie ike karịa nkume. Nʼihi ya, atụla ha egwu; ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-enupu isi, ma atụla ihu ha egwu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 3:9
15 Iomraidhean Croise  

atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.


Atula egwu, gi idide, bú Jekob, unu ndikom Israel; Mu onwem eyeworo gi aka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ọzọ, Onye-nb͕aputa-gi bu Onye Nsọ nke Israel.


Ma Onye-nwe-ayi Jehova nēyerem aka; n'ihi nka etiyeghm n'ọnọdu-ihere: n'ihi nka ka m'cheworo irum dika ọmú, ama-kwa-ram na ihere agaghi-emem.


Ma gi onwe-gi, ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, bilie, gwa ha ihe nile Mu onwem nēnye gi n'iwu: atula ujọ ha, ka M'we ghara ime ka i tu ujọ n'iru ha.


Atula egwu iru-ha: n'ihi na gi ka M'nọyere inaputa gi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa gi ka i ghọrọ ndi nka mb͕idi ọla ewusiri ike; ha gēbuso kwa gi agha, ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere izọputa gi na inaputa gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, atula egwu ha, atu-kwa-la egwu okwu nile ha, asi na ogwu na uke di n'ebe i nọ, asi kwa na ọ bu n'etiti akpi ka i bi: atula egwu okwu nile ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


O we sim, Nwa nke madu, okwum nile nke M'gāgwa gi, nara ha n'obi-gi, nuru kwa ha na nti-gi abua.


Le, emewom iru-gi ka ọ di ike megide iru-ha, ọ bu kwa egedege-iru-gi ka M'meworo ka ọ di ike megide egedege-iru-ha.


I gāsi kwa ndi nānupu isi, bú ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, site n'ihe-árú nile unu,


Ma otú ọ di mu onwem juputara n'ike, bú Mọ nke Jehova, na ikpé, na idi-ike, igosi Jekob njehie-ya, na igosi Israel nmehie-ya.


Ọ bu kwa obi-ha ka ha mere ka ha ghọ nkume adamant, ka ha we ghara inuru iwu Chineke, na okwu nile nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha zitere site na Mọ-Ya site n'aka ndi-amuma mbu: oké iwe we site na Jehova nke usu nile nke ndi-agha bia.


Nka di nma buru kwa ihe agānara nke-ọma n'iru Onye-nzọputa-ayi, bú Chineke;


Onye-ọlu-ubi nke nādọb͕u onwe-ya n'ọlu aghaghi ibu uzọ kère òkè na nkpuru-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan