Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 3:8 - Bible Nso

8 Le, emewom iru-gi ka ọ di ike megide iru-ha, ọ bu kwa egedege-iru-gi ka M'meworo ka ọ di ike megide egedege-iru-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Lee, emeela m ka ihu gị sie ike karịa nke ha, ka egedege ihu gị siekwa ike karịa nke ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 3:8
13 Iomraidhean Croise  

Ehab we si Elaija, Ì chọtawom, onye-irom? Ọ si, Achọtawom i: n'ihi na i rewo onwe-gi ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova.


Ma Onye-nwe-ayi Jehova nēyerem aka; n'ihi nka etiyeghm n'ọnọdu-ihere: n'ihi nka ka m'cheworo irum dika ọmú, ama-kwa-ram na ihere agaghi-emem.


Ma Mu onwem, le, ewerewom i nye ta ibu obodo ewusiri ike, na ibu ide ígwè, na ibu mb͕idi ọla, imegide ala nka nile, imegide eze nile nke Juda, imegide ndi-isi-ya, imegide ndi-nchu-àjà-ya, na imegide ndi ala ahu.


M'gēme kwa gi ka i ghọrọ ndi nka mb͕idi ọla ewusiri ike; ha gēbuso kwa gi agha, ma ha agaghi-enwe ike imegide gi: n'ihi na gi ka M'nọyere izọputa gi na inaputa gi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.


Ma ulo Israel agaghi-ekwe ige gi nti; n'ihi na ha adighi-ekwe igem nti: n'ihi na ulo Israel nile bu ndi nwere egedege-iru siri ike, ọ bu kwa ndi obi-ha siri ike ka ha bu.


Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Ma otú ọ di mu onwem juputara n'ike, bú Mọ nke Jehova, na ikpé, na idi-ike, igosi Jekob njehie-ya, na igosi Israel nmehie-ya.


Okwukwe ka o ji rapu Ijipt, n'ihi na ọ tughi egwu ọnuma nke eze ahu: n'ihi na ọ nọgidesiri ike, dika ọ nāhu Onye ahu Nke anāpughi ihu Ya anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan