O we sim, Nwa nke madu, Mu onwem nēziga gi jekuru umu Israel, jekuru mba di iche iche ndi nānupu isi, ndi nupuworo isi n'okpurum: ha onwe-ha na ndi bu nna-ha ejehiewo megidem, rue n'ubọchi nke ta.
N'ihi nka, gwa ulo Israel okwu, gi nwa nke madu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ bu kwa na nka ka nna-unu-hà kwulurum, n'imekpu emekpu megidem.
O we sim, Nwa nke madu, me ka afọ-gi rie, ọ bu kwa ngiri-afọ-gi nile ka i gēmeju n'akwukwọ-npiakọta nka nke Mu onwem nēnye gi. M'we rie; o we di n'ọnum dika manu-aṅu n'utọ.